MAKA EKENE MARIA
235. Ked’ofu oke ayiyo Nzụkọ ji ayọ Virgin Maria di Ngọzi ayiyọ?
Oke ayiyọ Nzụkọ ji ayọ Virgin Maria di Ngọzi ayiyọ bụ Ekene Maria.
236. Gua Ekene Maria?
Ekene Maria juputara na gratia Osebuluwa nọnyelu i’di Ngozi n’etiti ikporo nine ọ diazi Ngọzi bụ nwa afọ i bụ Jesu. Maria di asọ nne nke Chuwku yobel’anyi bụ ndi njọ ayiyọ kita n’amani ọnwu anyi, Amen.
237. Onye melu akuku izizi Ekene maria?
Ọ bụ angel Gabriel na Elizaeth di asọ ka Mmụọ-nsọ kpanili fa mebe akuku izizi Ekene Maria.
238. Onye melu akuku nk’abụọ Ekene Maria?
Ọ bụ nzụkọ nke Chukwu ka Mmụọ nsọ du we mebe akuku ke’abụọ Ekene Maria’.
239. Maka gini k’anyi g’eji n’Ekene Maria ugbol’ ugbolo?
If’anyi g’eji n’agu ‘Ekene Maria ugbol’ugbolo, bụ k’anyi we n’echetago iwel’aru
nke Nwa nke Chukwu ya na k’anyi welugo n’asopulu Nne anyi di ngọzi bụ nne nke Chukwu.
240. O nwelu if’ọzọ kpatal’ anyi g’eji n’agu ‘Ekene Maria ugbol’ugbolu ka?
Ife kpata’zikwọlunu anyi ji g’eji n’agu Ekene Maria ugbol’ugbolu, bu iji n’ayọ Nne
anyi di ngọzi k’o yọbal’anyi, bụ ndi ọjọ ayiyọ ekpo nine, radu n’amani ọnwu anyi.