MAKA NNA ANYI NỌ N’ENUIGWE
221. Onye mebelu ayiyọ nke’Eze anyi?
Jesu Kristi mebelu ayiyọ nk’Eze anyi.
222. Gua ayiyọ nk’Eze anyi?
Nna anyi nọ n’enuigwe, k’otito dịlị afa ị k’ọchịchị ị bia k’eme uche ị n’ụwa k’esi eme ya n;enuigwe nye anyi tata nni nk’ụbọsị anyi, gbaghalụ’anyi Mmefie anyi-ga dik’anyi si ghaghalụ ndi mefiel’anyi ekwena k’anyi kwenye na nlanye ma zọputa anyi n’ajọ
ife. Amen.
223. Onye k’akpọlụ Nna anyi n’ayiyọ nk’Eze anyi?
Onye akpọlụ Nna anyi n’ayiyọ nk’Eze anyi bụ Chukwu
224. Maka gịnị k’eji akpọ Chukwu Nna anyi?
Ifeji akpọ Chukwu Nna anyi bụ makana ya bụ Nna ndi otu-Kristi nine, ndi o si-na baptism di asọ welunye n’umụ ya.
225. Chukwu bụ Nna ọra nine ka?
Chukwu bụ Nna ọra nine makan’ya kelu fa nine, fụ fa n’anya n’echeazi fa.
226. Maka gịnị ka anyi ji asị Nna anyi m’ya abụrọ Nna m?
Ife anyi ji asị Nna anyi m’ya abụrọ Nna m bụ maka n’ebe anyi bụ ụmụ-nna, anyi
am’an ayolu sọ onwe anyi ayịyọ m’anyi ga ayọt’azili ndi ọzọ.
227. Anyi si k’otito dili afa ị, kedu isi ife anyi yọdụlụ?
Isi ife anyi yọlụ n’ anyi si k’otito dili afa ị bụ k’ife nine Chukwu kelu mal’ya, fụ ya n’anya, n’efe ya.
228. Anyi si k’ọchịchị ị bia, kedu isi ife anyi yodụlu?
Isi ife anyi yọlụ m’anyi si ka ọchịchị ị bia bụ ka Chukwu bia g’anọkwasi na nkpụlụobi anyi sitena gratia n’ụwa nka, k’o kpọbata anyi n’anieze ya nk’enuigwe n’ụwa ọzọ.
229. Anyi si k’eme uche i n’ụwa k’esi eme ya n’enuigwe kedu isi ife anyi yọdụlụ?
Isi ife anyi yọlụ m’anyi si k’eme uche I n’ụwa k’esi eme ya n’enuigwe bụ ka Chukwu nyel’anyi aka sitena gratia k’anyi we n’eme ife nine o chọlụ, ka Ndi di Ngọzi si emelu ya n’enuigwe.
230. Anyi si Nye anyi tata nni nk’ubọsi anyi kedu isi ife anyi yọdụlụ?
Isi ife anyi yọlụ m’anyi si Nye anyi tata nni nke ubọsi anyi bụ ka Chukwu n’enye anyi kwada ife nine n’akpa anyi na nkpụlụobi n’aru.
231. Anyi si gbaghalụ anyi nmefie anyi ga dika anyi si gbaghalụ ndi nmefielu anyi kedu isi Ife anyi yọdụlụ?
Isi ife anyi yọlụ m’anyi si ghaghalụ anyi nmefie anyiga dik’anyi si gbaghalụ ndi nmefielu anyi bụ ka Chukwu ghaghalụ anyi njọ anyiga k’anyi si agbaghalu ndi ọzọ ife fa mefiegalụ anyi
.
232. Anyi si ekwene k’anyi kwenye na nlanye, kedu isi ife anyi yọlụ?
Isi ife anyi yọlụ m anyi si ekwena k’anyi kweneye na nlanye bụ ka Chukwu nye anyi gratia ya k’anyi ghalụ ikwenelụ nlanye.
233. Anyi si zọpụta anyi n’ajọ ife, kedu isi ife anyi yọlụ?
Isi ife anyi yọlụ m anyi si zọpụta anyi n’ajọ ife bụ ka Chukwu weputa anyi n’ajọ ife nine ka nke nkpụlụobi ka nk’aru.
234. kedu isi ife bu Amen?
Isi ife bụ Amen bụ k’o si nọ fụ di