MAK’AYỊYỌ

217. Gịnị bụ ayịyọ?
Ayịyọ bụ iwenite uche n’obi enu n’ebe Chukwu nọ.
218. Kedụ k’anyị si ewenite uche anyị n’obi anyị enu n’ebe Chukwu nọ?
K’anyị si ewenite uche anyị n’obi anyị enu n’ebe Chukwu nọ bụ site n’ilo ilulo maka Chukwu, site n’ise-kpuru ya, ito ya, n’inye ya ekene na site n’iyọ ya ngọzị nine maka nkpụrụobi n’arụ.
219. Ndị n’abụ fa n’ayọ Chukwu fa na ad’elo maka Chukwu nke fa n’eche
ife fa n’ekwu eche fa n’ayọkwafụ ayịyọ ka?
Ndị bụ fa n’ ayọ ayịyọ fa ad’ elo maka chukwu, nke fa n’ eche ife n’ ekwu eche, ad’ ayọkwọ ayịyoọ ekelesu (kwụọtọ). Kamakwa fa n’ achọ chukwu okwu, m’ ibụrụ na fa kpachal’ anya nabọ n’ eloli ife ọzọga.
220. kedụ nke bụ ayịyọ kachasị mma?
Ayịyọ kachasị mma bụ: Nna anyị nọ n’ enuigwe mọbụ ayịyọ nk’
ezeanyị.