MAKA GRASỊA
209. Gịnị bụ grasịa?
Grasịa bụ onyinye mmụọ Chukwu ji eme ọgọ, ọ n’enye anyị ya na nkịtị maka odido asọ anyị na nzọpụta anyị.
210. Ụzọ grasịa ole dị?
Fa dị ụzọ nabọ; grasịa nnọnyelu nke an’akpọ grasịa n’edo asọ na grasịa
inye aka.
211. Gịnị bụ graSịa n’edo-asọ?
Ọ bụ grasịa Chukwu n’erukwasị na nkpụrụobi mmadụ ọ n’eji echekwa ya, nke n’eme k’anyị nọdu na mma dị asọ, bịa si n’ofu me k’anyị dị mma inwe ndụ ebebe.
212. Ked’ife ọ n’abar’ anyị bụ grasịa n’edo asọ?
Ife grasịa n’edo asọ n’abar’ anyị bụ n’ọ n’eme k’agba gharụ anyị njọ anyị ga, n’edo anyị asọ na k’anyị bụrụazị ụmụ nke Chukwu ụmụ nna nke Jesu Kristi ụnọ-obi nke mmụọ-nsọ na n dị g’eketa enuigwe.
213. Gịnị bụ grasịa inye-aka?
Grasịa inye-aka bụ inye aka nke nkpụrụobi, Chukwu n’enye anyị iji melu anyị ọgọ. K’anyị welụ ya ana ezelụ njọ, welụzịa ya n’eme mma.
214. Chukwu ọn’enye mmadụ nine grasịa n’ezugalụ fa?
Eye, makana Chukwu chọrụ ka azọpụtagbado mmadụ nine, ka fa bịa mat’azị ife bụga ezi okwu (1 Tim. II,4)
215. Ọ nwelu n’anyị g’ajụ grasịa nke Chukwu?
Eye, anyi n’ajụazị grasịa nke Chukwu ugbor’ugboro dịka Akwụkwọ dị asọ sị kwuo sị ụnụ n’ajụka na Mmụọ-nsọ mgbencha. (Act VII, 51)
216. Kedụ k’anyị g’esi n’anata grasịa nke Chukwu?
K’anyi g’esi n’anata grasịa nke Chukwu bụ nanị site n’ayịyọ na Sacrament ga dị asọ.