MAKA NCHEKWUBE
204. Sọ okwukwe g’azọ anyị ka?
Sọ okwukwe am’azọkwọ anyị m’ezi ọrụ adịrọ ya, anyị agbarọzikwọ inwe nchekube n’ịfunanya.
205. Maka gịnị ka s’okwukwe aman eji zọ anyị?
Sọ okwukwe am’azọkwọ anyị makana James dị asọ kwuru sị; n’okwukwe n’enwero ezi ọrụ nwụrụ anwụ n’ọnwe ya (Jam 11:17).
206. Gịnị bụ nchekwube?
Nchekube bụ onyinye mụọ Chukwu ji eme ọgọ, nk’anyị n’esite n’ya echekwube Chukwu s’ike n’og’enye anyị ndụ ebebe n’ife nine g’enyere anyị aka iji we nwe ya m’ọ bụrụ n’anyị eme ife ọ sị anyị megaa.
207. Kedụ ife anyị g’eji wechekwube Chukwu?
Ife anyị g’eji wechekwube Chukwu bụ na afọ-ọma ya n’ike ya enwerọ ube,ọ n’emegbado ife ọkwelu na nkwa.
208. Anyị apụrụ ịrụ ezi ọrụ ọbụna n’onw’anyị iji kpọneylu nzọpụta anyị
aka ka?
O nwerọ ezi ọrụ ọbụna anyị pụrụ ịrụ n’onw’anyị iji kpọnyelụ nzọpụta
Anyị aka, anyị g’achọ ịnyeaka grasịa nke Chukwu.