OK’IRI N’ỊBỤA NK’OKWUKWE
199. Kedụ nke bụ ok’iri nịbụa nk’okwukwe? Ok’iri nịbụa nk’okwukwe bụ na ndụ ebeebe.
200. Kedụ isi ife bụ na ndụ ebeebe? Isi ife bụ na ndụ ebeebe bụ na ndị ọma g’ebi n’ime otiti n’aṅụrị nk’ Enuigwe ebeebe.
201 Gịni bụ Otito n’aṅụrị nk’enuigwe? Ife bụ otito n’anụrị nk’enuigwe bụ ifụ Chukwu anya n’afụ ya na anya, n’aṅụrị na ya ebeebe.
202. Kedụ ife Akwụkwọ dị asọ kwuru maka aṅuri nke enuigwe? Ife Akwụkwọ dị asọ kwuru maka aṅurị nke’enuigwe bụ N’anya afunurọ, nke ntị nanụ, nke ọ nabanye n’ime obi mmadụ ife Chineke kwadoberu ndị fụrụ ya n’anya (1 Kor.II,9).
203. Ọ bụ na ndị ajọ mmadụ am’adị ebebe ka? Ndị ajọ mmadụ g’adịazị ebebe m’ag’apịa fa ịtalị ebebe n’ime ọkụ mmụọ .