MAKA NJỌ
184. Gịnị bụ njọ?
Njọ bụ ịchọ Chukwu okwu site n’ilulo n’okwu n’omume m’ọbụ n’ife aragalụ megide iwu nke Chukwu.
185. Fa dị ụzọ njọ one dịnụ?
Fa dị ụzọ njọ abụọ dịnụ njọ eker’ụwa nan jọ emere eme.
186. Gịnị bụ njọ eker’ụwa?
Njọ eker’ụwa bụ nlakụrụ nke njọ anyị ketalụ n’arụ Adam onye bụ ntọ-ani n’isị ọra nine.
187. Kedụ afa njọ Adam mere?
Njọ Adam mere bụ ajọ ekwe ekwe ọ kachiri ntị ga ta nkpụrụ’osisi asị ya atana.
188. Gịnị bụ njọ emer’eme?
Njọ emer’eme bụ njọ nine anyị ji aka anyị we me.
189. Kedụ k’esi wee kedụ njọ emere eme?
Ekere ya ụzọ nabọ:njọ ogbugbu na njọ di mgbaghalụ
190. Gịnị bụ njọ ogbugbu?
Njọ ogbugbu bụ oke ife mmadụ mere weechọọ Chukwu okwu.
191. Maka gịnị k’eji akpọ ya njọ ogbugbu?
Ife eji akpọ ya njọ ogbugbu bụ nọn’egbu mkpụruobi na akpatarụ onye afụ
ịba n’ọkụ mmụọ.
192. Kedụ ka njọ ogbugbu si egbu mkpụrụobi?
Ka njọogbugbu si egbu nmkpụrụobi bụ site n’ịnapụ ya grasịa n’edo asọ
bụ ndụ mmụọ nke mkpụrụobi n’adị.
193. Ọbụdụ ajọ ife bụ ịdaba na njọ ogbugbu ka?
Ife kasị njọ adịrọzi, ka ịdaba na njọ ogbugbu.
194. Kedụ ebe fa g’eje bụ ndị nwụrụ n’ime njọ ogbugbu?
Ndị nine bụ ndị nwụrụ n’ime njọ ogbugbu ,g’abachasị n’ọkụ-mmụọ
ebebe.
195. Gịnị bụ njọ dị mgbaghalụ?
Njọ dị mgbaghalụ bụ mmefie n’adị egbu mkpụrụobi, ma ọna
Chukwu njọ, n’edunyeazị na njọ ogbugbu.
196. Maka gịnị ka eji akpọ ya njọ dị mgbaghalụ?
Ife eji akpya njọ dị mgbaghalụ bụ mak’ ana agbaghalụ narị ya njọ
ogbugbu.