OKWUKWE
- Onye kelụ ị?
Chukwu kelụ m.
- Maka gịnị ka Chukwu ji ke ị?
Chukwu kelụ m ka n’malụ ya, ka m fu ya n’ anya, ka m fee ya n’ ụwa, ka m wee binyelu ya n’ aṅulị ebebe n’ ụwa ọzọ.
- Onye k’ i yili ka chukwu kelu ị?
Chukwu kelu m, m yie ya.
- Ọ bụ n’ arụ ị k’ yili Chukwu oyiyi a k’ ọ bụ a nkpụrụobi ị?
Oyiyi a m yili Chukwu ka na nkpụrụobi m.
- Kedu ka nkpurụobi ị siri yie Chukwu?
Nkpụrụobi m yili Chukwu makana ọ bụ mụọ bụrụ anwụ anwụ.
- Kedu isi ife bụna nkpụrụobi ị bụ anwụ-anwu?
Isi ife bụ na nkpụrụobi m bụ anwụ- anwụ bụ na nkpụrụobi m amanwụnata anwụ.
- Ọ bụ arụ ị k’ i g’ akpachapụ narịlị anya k’ ọ bụ nkpụrụobi ị?
Aga m akpachapụ narịlị nkpụruobi m anya makana Kristi ekwugo: ‘Ked ife ọ gabalụ mmadụ m’ ọ bụlụ n’ olitesịa ụwa nine n elele ma nkpụrụobi ya efu narị ya’.
- Gịnị k’ ị g’ eme wezọlụ nkpụrụobi ị?
Ife m geme wezọlụ nkpụlobi m bụ n’ agamefe Chukwu sit’ na okwukwe, na nchekwube, n’ ifunanya, isi ya bụ n’ agam ekwelu n’ ya, chekwube na ya: agam eji obim nine fụ ya n’ anya.