MAKA NMEKỌ NKE NDỊ NSỌ
177. Kedụ isi ife bụ na nmekọ nke Ndị nsọ?
Isi ife bụ na nmekọ nke Ndị nsọ, bụ nan dị otu Nzụkọ nine dị n’enuigwe n’ụwa na Pọgatịrị n’emekọrịta nke fa ji bụrụ ofu arụ nime Jesu Kristi.
178. Kedụ ka ndị kwere nụ n’ụwa a si emekodo?
Ka ndị kwelu n’ụwa a si emekọ bụ na fa kwekọlụ n’ofu okwukwe afụ, kwelụ ofu ike afụ, jide ofu ịchụ aja, n’enyelụ ibe fa aka site n’ayịyọ n’ezi ọrụ.
179. Kedụ k’anyị na Ndị-nsọ dị n’enuigwe si emekodo?
K’anyị na Ndị-nsọ dị n’enuigwe si emekọ bụ site n’ịsọpụrụ fa ka ndị otu Nzụkọ edolu’otito na site’azị n’ịyọ fa ayịyọ, fa nwa n’ayọazịrị’anyị ayịyọ.
180. Kedụ k’anyị na nkpụrụobi ndị nọ na Pọgatịrị si emekọ?
K’anyị na nkpụrụobi ndị nọ na Pọgatịrị si emekọ bụ site na inyelu fa aka site n’ayịyọ anyị ga, ya n’ezi ọrụ anyị ga ọ bụ ilulo dị asọ, dịazị mma, bụ ịyọlụ ndị nwụrụ anwụ ayịyọ k’ewegbatọpugo fa nan jọ (II Macch, XII, 46)
- chukwu ezirọ ndị afụ , makan’ asị na Chukwu ziri fa, fa ak’ enwe obi dịasọ fa bigalụ, n’ ọrụ ebube fa rụgalụ iji gosinụ
- ndị apostụl eziro fa dịka fa bidolu k’ ọ dịna bel’ ọgụ arọ ise na nnụ arọ ịnọ ndị Apọstụl gafesịgoluriị.
- Nzụko Katoliiki eziro fa makam’ ọ sụpụrụ fa asụpụ mak’ ifi njọ fag a. kezi ka fa si nwe ike nkuzi ma eziro fa ezi(Rom,X 15)