MAK’EMEFIE EMEFIE NKE NZỤKỌ
175. Nzụkọ g’akụzifie n’ife ọ n’akuzi ka?
Mba, Nzụkọ apụrọ ikuzifena nkuzi ọ n’akuzi banyelụ n’okwukwe mọbụ omume, makan’ya bụ onye ndu dị emefie emefie anyi nwelụ na fa.
176. Kedụ k’isi malụ na Nzụkọ apụrọ ikuzifie n’ife o n’akuzi?
Ka m si mal ụna Nzụkọ apụrọ ikuzifie n’ife ọ n’akuzi bụ makana Kristi kwelụ nkwa na ọnụzọ ọkụ-mmụọ am’emelinata Nzụkọ ya; na Mụọ-nsọ g’akuziri ya ife nine na ya n onwe’ya g’anọnyelụ ya mbọsị nine w’ganye n’isi-njedebe nk’ụwa. (Matt XVI. 20: John XIV, 121 Tim. III. 15)
- Nzụkọ protestantị ọ bụ apọstọliiki?
Mba:
- Bụ na nkuzi ya abụrọ nke ndi apọstụl, makana fa n’ arụ ụka na nkuzi nke ndị Apọstụl, dịka Pọọlụ dị asọ si n’ akwụkwọ nsọ; ụmụ- nna m kwusie nụ ike we jide nkuzi ọdịbendị amụgosiri’ unu site na OKWU ANYI mọbu site n’ akwụkwọ anyi degalụ (II Thess. III,14) ma ndị Protestantị ajụ ijide nkụzi ọdịbendị.
- Buru n’ ọchịchị ndị ụkọ-Chukwu ya abụrọ nke ndị Apọstụl Ndị protestantị ụfọdụ ad’ enwe Ụkọ-Chukwu, ma ndị debelunụ na fa nwel’ enwe enwer makana ndị protestantị mbụ chil’ echi ejirọ ike ọbụna fa chili na nkịtị.
- Bụrụ n’ ọrụ yaga ebidoro n’ oge ndị Apọstụl m ya bidolu so n’ aka Luther na Henry nke ịsatọ