MAK’AKARA NKE NZỤKỌ
168. Nzụkọ Kristi ọnwelu akara anyị g’eji n’ama ya ka?
Eye, Nzụkọ Kristi nwelụ akara ịnọ anyị g’eji n’amata ya,
1. Ọ bụ ofu;
2. Ọ dị asọ;
3. Ọ bụ Katọliiki;
4. Ọ bụ Apọstọlik.
169. Kedu ka nzụkọ si bụrụ’ofu?
Ka Nzụkọ si bụrụ’ofu bụ makana ndị otu ya nine kwelu n’ofu okwukwe, jide ofu ịchụ aja na Sacrament afụ bịa dị n’okpulu ofu onyeisi. (I)
170. Maka gịnị k’ezi ụka g’eji bụrụ ofu?
Ọ bụ makana Kristi n’onwe ya kwụrụ si: N’ọ g’adị s’ofu igwe atụrụ n’ofu onye-nche atụrụ. Pọọlụ dị Ngọzị bịa kwuazịa si: N’ọbụ s’ofu Chukwu dị ya n’ofu okwukwe.
171. Kedụ ka Nzụkọ si dị aso?
Ka Nzụkọ sị dị asọ bụ n’ọ n’akụzi nkuzi dị asọ, n’enye madụ nine ife fa g’eji dị asọ, ọ bịa pụazi iche siten’oke ịdị asọ nnụ kwuru nnụ ya n’adị ga. (2)
172. Kedụ isi ife bụ Katọliịki?
Isi ife bụ Katọliiki bụ ozulu mba ọnụ.
173. Kedu ka Nzụkọ si bụrụ Katọliiki?
Ka Nzụkọ si bụrụ Katoliiki bụ n’ọdị ọkpụ tọrọ ọkpụ n’akụziri mba nine ka nkuzi ra. (1)
174. Kedụ ka nzụkọ si bụrụ apọstọlik?
Ka Nzuko si bụrụ apọstọlik bụ makana nkuzi ya, n’ọchịchị ndị Apọstụl am’emekata ghalụ. (2)
1. Nzụkọ Protestantị ọ bụ ofu ka?
Mba, nzụkọ protestantị abụrọkwa ofu makana ọ nwegalụ ọtụtụ isi dịazị n’ iche, ọ nwerọkwazị ofu okwukwe; ụfọdụ nwere Bishọọp, n’ anụ sọ nke okwuru, dịka nzụkọ nke ndị England, m ụfọdụ nime fa ekwenyerọ n’ inwe Bishọọp dịka ndị protestantị an’ akpọ Presịbiterianụ.
2. Nzụkọ protestantị ọdị asọ ka?
Mba makana ndị tọlụ ntọ ani ya adịrọga asọ. Nedu Henrị nk’ ịsatọ nke gbugalụ inyem yaga, k’ ọtụtụ ndị ụkọ- Chukwu azị. Nkuzi ya adịrọ asọ makan’ ọ sina ezi ọrụ abarọ n’ ife ọbụna n’ ụzọ nke nnapụga.
1.Nzụkọ protestantị ọbụ Katọliiki ka?
1.makana ndị protestantị nine kpọlụ afa afụ asị
2. ụka nzụkọ nke Englandị dị sọ na Englandị ma ndị English Protestantị nine ekwenyerọlụ nzụkọ nke Englandị dị ‘High Church’’
3.ụka protestantị adịrọ ọkpụ tọrọ ọkpụ, o bidoro eri arọ onem’ one.
4. nkụzi ya nine bụrụ ọkara nkuzi nke Kristi.