OK’ITENANỊ NK’ OKWUKWE
147. Kedu nke bụ ok’ iteanị nk’ okwukwe?
Ok’ iteani nk’ okwukwe bụ: na nzụkọ nsọ Katọliiki na mmekọ nke ndị-nsọ.
147. Gịnị bụ nzụkọ Katoliiki?
Nzuko catholic bu idiko n’ ofu nke ndi nine kwelunu no na okpulu ofu onye- isi
148. Onye bụ isi nke nzụkọ Katọliiki?
Onye bụ isi nke nzụkọ Katọliiki bụ Jesu Kristi. Osebụrụwa anyi.
149. Nzụkọ ọnwekwere ofu ony-isi an’ afụ anya n’ ụwa ka?
Eye, nzụkọ nwelụ ofu onye- isi n’ ụwa nụnwa; Bishọọp nke Rome bụ onye nọchiri anya Kristi.
150. Maka gịnị ka bishọọp nke Rome ji bụrụ onye isi nke nzụkọ?
Ife Bishọọp nke Rome ji bụrụ isi Nzụkọ bụ, makana ya nọchiri anya Peter dị asọ, onye Kristi mere k’ ọ bụrụ isi nzụkọ.
151. Kedụ k’ isi marụ na Kristi mere Pita dị asọ k’ ọ bụrụ isi nzụkọ?
Ka m si marụ na Kris mere Pita dị asọ k’ ọbụrụ isi nzụkọ bụ, makana Kristi agwag’ ya sị: ngị bụ Pita n’enu okwute nụnwa ka m g’ arụkwasị nzụkọ m, ọnụzọ ọkụ-mmụọ am’ emelinata ya-ngị ka m g’ enye igodo anịeze nk’ enuigwe.
152. Gịnị k’ an’ akpọ Bishọọp nke Rome?
Ife an’ akpọ Bishọọp nke Rome bụ Popu isi ya bụ nna.
153. Popu ọbụnna nkpụrụobi nke ndị- otu Kristi nine ka?
Eye, Popu bụ nna nkpụrụobi nke ndị otu Kristi nine.
154. Popu ọ bụ onye nche n’onye-nkuzi nke ndị otu-Kristi nine ka?
Eye, pope bụ onye-nche n’onye-nkuzi nke ndị otu-Kristi nine makana Kristi mere Pita dị asọ onye-nche igwe atụrụ ya nine k’ọsị: Zụba ụmụ atụrụ m, zụba atụrụ m ga. Ọ yọazị ayịyọ k’okwukwe ya ghalụ ịdanụ sị ayọgolum Ị ayịyọ Pita k’okwukwe Ị ghalụ ịdanụ ma ekpo I loghalụ, me obi ụmụ-nna Ị sie-ike.
155. Popu ọdị emefie emefie ka?
Eye, Pope dị emefie emefie.
156. Kedụ isi ife bụ na Popu dị emefie emefie?
Isi ife bụ na Popu di emefie emefie bụ na Popu am’emefienata m’ọ nọkwasịrị k’onyenche n’onye nkuzi nke ndị otu-Kristi, ntọ anị nkuzi na’okwukwe, mọbụ omume nzụkọ nine gan’eso.