OK’ ASATỌ NK’ OKWUKWE
141. Kedu nke bụ ok’ ịsatọ nk’ okwukwe?
Ok’ ịsatọ nk’ okwukwe bụ Ekwem na Mmụọ-nsọ
142. Onye bụ mmụọ-nsọ?
Mmụọ- nsọ bụ pesịn nk’ ịtọ n’ ime ịtọ n’ ime otu dị ngọzị.
143. N’ onye ka mmụọ-nsọ si pụta?
Mmụọ-nsọ sin a Nna na Nwa pụta.
144. Mmụọ-nsọ na Nna na Nwa fa-a r aka?
Eye, mmụọ-nsọ na Nna na Nwa ra nranya, makana ọ buzu ofu osebụrụwa n’ ụdị Chukwu fa dị.
145. Kedu mbọsị mmụọ-nsọ ji zidatakwasị ndị Apọstụl?
Mbọsị mmụọ- nsọ zidatakwasịrị ndị Apọst ụl bụ mbọsị Penticọstụ n’ ụdị ire ọkụga.
146. Gịnị kpatalụ mmụọ- nsọ ji zidatakwasị ndị Apọstụl?
Ife mmụọ- nsọ ji zidatakwasị ndị Apọstụl bụ k’ ọ wee me okwukwe fa sie ike, k’ o do fa asọ, ya na k’ onyelu fa aka ido nzụkọ.