MAK’ ỌKỤ- MMỤỌ
138. Gịni bụ ọkụ- mmụọ?
Ọkụ- mmụọ bụ ebe Chukwu n’ apịa ekwensu ịtarị apịabe apiabe k’ ya ka ndị nine nọga na njọ ogbugbu we nwụ.
139. Achọgodulu na madụ g’ eme imelime njọ ogbugbu tupu ọ bịa bana n’ ọkụ-mmụọ?
Mba, s’ ofu njọ ogbugu ezugo iweba mmadụ n’ ọkụ mmụọ.
140. Ked’ afa afụfụ ndị nọ n’ọkụ- mmụọ n’ ata?
Afa afụfụ ndị nọ na ọkụ-mmụọ n’ ata.
- Bụ na fa am’ afụnata Chukwu anya
- Bụ n’ ọkụ g’ anarụ fa ebebe
- Bụ imelime afụfụ ọzọga di n’ iche n’ iche.