MAK’IFE ONYE OTU-KRISTI G’EME KWADA
MAK’IFE ONYE OTU-KRISTI G’EME KWADA
546. Kedu k’ig’esi n’ebido ụbọsị?
Ka m’gesi n’ebido ụbọsị bụ siten’ime akala nk’obe ma m’teterafụ n’ụtụtụ, sit’azịna ịyọ nwantịntị ayịyọ dịka nke nụnwa: O Chukwu nkem enyem Ị obi m na nkpụlobi m.
547. Kedu k’ị g’esi n’ekunịdu n’ụtụtụ?
M kunie n’ụtụtụ edozie m akwa m ọfụma, sekpulu yọ ayịyọ ụtụtụ m.
548. Ị ga n’anụazị Mass m’ịfụ efe ya ka?
Aga m eje Mass ma m fụ efe ya makan’ ịnụ Mass kacha sị mma, n’aba narị n’ife.
549. Anyi g’an’agụdụ akwụkwọ dị mma ugbol’ugbolu ka?
Anyị g’an’agụ akwụkwọ dị mma ugbol’ugbolu, dịka Ozi-oma dị asọ, na ndụ Ndị dị asọ.
550. Kedu’ife ịg’an eme dịka n’ili ife, n’Ịla ife, n’Ịla ụla n’igwu egwu?
Ọ bụlụ nke ili ife, n’Ịla ife, n’Ịla ụla, n’igwu egwu aga m ‘edolu arụ anị n’achọ fa k’ọg’esi adị Chukwu mma.
551. Gụa Inye-ekene tupu olili ife?
Gọzie anyị n’onyinye Ị nụnwaga, O Osebulụwa, anyị jeko g’anata n’afọma Ị site na Kristi Eze anyị, amen.
552. Gụa Inye-ekene nk’elisie ife?
Anyị enye Ị ekene, o Chukwu, onye pụlụ ime ife nine mak’ife nine Ị n’emel’anyị, onye dị ndụ, n’achị ụwa ebebe, amen.
Ka mkpụlobi ndị kwelunu gal’aga si n’ebele nke Chukwu wee zul’ike na ndokwa”.
553. Ked’ife Ị ga n’emedu ma ife nlanye nunyebe Ị nanjọ?
Ife m’g eme ma ife nlanye nunyebe m na njọ bụ eme m akal’obe n’obi m ọfụma sị osebulụwa zọpụta m omezi n’efurum.
554. Ọ bụlụ n’ịdaba na njọ ked’ife ị g’eme?
Ife m’g’eme ma m’daba na njọ bụ, ewelum obi ume-ani wee yọ Chukwu mgbaghalụ siten’omume nk’ime’ebele emesịa ejem nkwuputa.
555. Kedu k’ị g’esi g’ejedebe ụbọsị?
Ka m g’esi g’ejedebe ụbọsị bụ site n’ isekpulu anị yọ ayịyọ nk’anyasị m.