MAKA PỌGATỊRỊ
134. Gịnị bụ pọgatịrị?
Pọgatịrị bụ ebe nkpụrụobi n’ anọ nwa oge ma mmadụ nwụsịa, welụ ta afụfụ maka njọ ya.
135. Kedu nkpụrụobi ndị n’ eje na pọgatịrị?
Nkpụrụobi ndị n’ eje na pụgatịrị bụ nke bu njọ dị mgbaghalụ wenwụ, mọbụ nke n’ akwụsịrọ ụgwọ nk’ ịtalị oge dịrị njọ fa megalụ nke agbaghalụgolu amamikpe fa.
136. Nkpụrụobi nọdụ na pọgatịrị fa n’ ata afụfụ rine (nnukwu)?
Eye, maka ekwerọ fa ka fa fụ Chukwu anya, fa n’ ata narị afụfụ karịa onye ọ bụna n’ ụwa.
137. Kedu k’ isi mata na pọgatịrị dị?
Ka m si mata na pọgatịrị dị bụ site na nkuzi ekpomekpo nzụkọ n’ akuzi,na site na nkuzi nke Akwụkwọ dị asọ nke kwurunụ na Chukwu g’ emenye onye k’ ọrụ onye si dị- n’ ife rụrụ arụ amabanata n’ enuigwe- n’ ọg’ azọ nwo m’ ọ g’ abụkwa dịka esiri n’ ọkụ.( Matth.XVI-27-Ifenkpughe XVI, 27- Cor.III.15)