MAK’IKE NDỊ N’ACHỊ ANỊNWELU N’ANỤMDI
MAK’IKE NDỊ N’ACHỊ ANỊNWELU N’ANỤMDI
543. Ndị n’achị anị fa nwelu ike na Sacrament nk’anụmdi?
Mba, ọ bụ sọsọ Ụka nwel’ike na Sacrament nine ga.
544. Ọ bụlụ na ndị n’achị anị agbatọpụ nkedo anụmdi, fa gbatọpụlụ ya n’iru nke Chukwu ka?
Mba, makan’ife Chukwu kedolu madụ apụrọ ịgbatọpụ ya’yabụ ndi agbatọpụlụ n’ụzọ dị nọfụ, fa je nụlụ di mọbụ nwunye ọzọ melu njọ medide iwu nk’Isi nke Chukwu.
545. Ndị n’achị anị nwel’ike iti iwu maka anụmdi ka?
E ye, fa nwel’ike a m’ọ bụlụ maka ọdi-mma nk’obodo, ma fa ghalụkwọ imetu Sacrament ncha.