MAKA EKETO-EKETO
MAKA EKETO-EKETO
536. Nkedo di na nwunye o nwelu mgbatọpụ ka?
Mba, o nwenatarọ mgbatọpụ makana Paul dị asọ kwulu si ndị nụlụ di na nwunye: ‘ọ bụrọkwọ m malụ iwu, m’ọ bụ Osebulụwa malụ ka nwunye ghalụ irapụ di ya, m’ọ bụlụ n’ọ rapụ, ya anụkwana nwoke ọzọ mọbụ yana di ya dokwa, Ma di achụpụna nwunye’, (1Kor, VII, 10-11).- Na Jesu Kristi Kwuazịlị sị ife Chukwu dokolu ọnụ, mmadụ amekewaya’(Matth, XIX,6).
537. Ked’ife pụlụ ikewa di na nwunye?
Ọ bụ sọsọ ọnwụ ofu onye nime fa.
538. Ked’ife dị na nwunye kewalụ onwe fa g’ eme?
Fa g’edokwa, gbaghalụzi onwe-fa o mezi nọfụ di am’enwe nwunye ọzọ, na nwunye am’enwe di ọzọ.
539. Onye nwelu imelime inyomu, gịnị k’ọg’eme m’ọchọ k’ọ bụlụ onye Otu-Chukwu?
Ọ g’achụpụsị inyomu ya nine, debe s’ofu.
540. Kedu nwunye ya nk’ọg’edebe?
Ọ bụ nke ọ nụtalụ n’izizi k’ọ g’edebe m’ọ bụlụ n’o nwelu ife g’anara ya ya: o mezi nọfụ ọ rọlụ ofu n’ime ndị ọzọga.
541. O nwelu ọkwa dị ezigbo kalia anụmdi?
E ye, o nwelu, ọ bụ ịghalụ ịnụ di mak’ifi nke Chukwu dịka “Paul” dị asọ, si kwu “Ya bụna” onye kelu ada ya n’akarọ nwe di melu ọfụma; ma onye n’ekero, mekalịlị ọfụma. (1Kor. VII,28).
542. Ndị otu Chukwu nine g’anụ di n’ime Chukwu ka?
Mba, ọ bụ nọfụ k’iwu nke Nzụkọ si dị.