MAK’IFE GANARA NWOKE N’OKPORO ỊNỤ DI
MAK’IFE GANARA NWOKE N’OKPORO ỊNỤ DI
522. Ndị chọlụnụ ka fa nụlụ di dịka etu Chukwu n’ụka si doo fa g’anụlụ onye ọbụna asọna fa ka?
Mba, o nwelu ndị fa m’an’anụ.
523. One ndị bụ ndị afụ fa mananụ?
Fa bụ ụmụ-nna, ụmụ-nne, fa amanụta onwe fa wee lue na ndụdụgandụ nk’ịnọ.
524. Onye Otu-Chukwu g’ekuchi nwunye nna ya ka?
Mba, ọ m’ekuchikwo ya.
525. Onye Otu-Chukwu g’ekuchi nwunye nwanne ya ka?
Mba, ọ m’ekuchikwo ya.
526. Nna na Baptism g’anụkwọlị nwa ya na Baptism?
Mba, ọ m’anụkw’ya belụsọ m’ọ natalụ ike siten’aka nk’ụka.
527. Onye Otu-Chukwu g’anụkwọlị onye Ọ baptisịlị?
Mba, ọ m’anukw’ya belụsọ m’ọ natalụ ike siten’aka nk’ụka.
528. Ụka n’ekwenyekwo n’anụmdi nk’onye Catholic n’onye Protestant?
E ye, Nzụkọ n’ekwenye oge ụfọdụ siten’inye ike ma ife g’akpata ya g’esikwọ ike, ọ dịazị na’mbe.
529. Ụka n’ekwenyekwo n’anụmdi nk’onye Catholic n’onye nk’ụwa?
E ye, ụka n’ekwenye ụfọdụ m’ọ bịa na nkpa.
530. Kedu iwu dịlị ndị nwelu ife g’anara fa n’anụmdi?
Fa g’akọlụ Ụkọ-Chukwu fa ọdachi ya, ọ bụlụ n’ụka enye fa ike, fa nụba, m’onyezị fa, fa ghalụ.
531. Ked’ife achọlụ n’aka ndị jeko g’anụ onwe fa tupu ụka abịa nye fa ike ịnụnụ?
Ọ dị ụzọ nnukwu ife nabọ achọlụ n’aka fa; nke mbụ bụ n’onye nke nabụrọ Catholic am’anarakwọ onye Catholic ịlụ ọlụ dịlị ya na Nzụkọ ya; nk’ịbụa bụ, n’ag’abatisi ụmụ fa, zunit’azị fa na Nzụkọ Catholic.
532. Ked’ife achọkwazịlị n’aka ndị jeko g’anụ di?
If’ọzọ achọkwazịlị n’aka fa bụ; na fa g’elugodu ogo, weluazị obi wee kwenye n’anụmdi, ghalụ ịtụ egwu n’ilafu onwe fa.
533. O nw’azịlị if’ọzọ achọlụ n’aka ndị g’anụ di?
Eye, fa g’ekwelu na fa g’abụ di na nwunye na ndụ fa nine.
534. Ọ bụ njọ m’ọ bụlụ n’onye fụ ife lụlụ alụ n’etiti ndị g’anụdi, zobe, ghalụ ịgwa ndị Ụkọ-Chukwu?
E ye, onye-afụ melu nnukwu njọ, makana ụka kwulu n’onye fuụụnụ, zobe m’ya ekwuputarọ, ag’asụpụ ya.
535. Maka gịnị k’Ụkọ-Chukwu ji akpọ afa ndị g’anụ di n’ụka?
Ọ bụ ka ndị Otu-Chukwu yọlụ fa ayịyọ’meazị ka ndi Ụkọ-Chukwu malụ ife g’anara anụmdi fa.