MAKA MATRIMONY
MAKA MATRIMONY
514. Gịnị bụ Matrimony?
Matrimony bụ Sacrament nke n’edo di na nwunye asọ n’ụzọ kwụ ọtọ nke adịzi nkewa, nye fa gratịa iji bi obi fa ka ndị Otu-Chukwu wee n’azụnita ụmụ fa n’egwu nke Chukwu.
***515.Anyị si agha malụ na Matrimony bụ Sacrament?
Anyị mal’ya n’okwu ‘Paul’ dị asọ nke kwulu ya n’ofu akwụkwọ o degalụ ndi ‘Efesus’ si Sacrament nkea ebuka, Ka m kwulu n’ọbụ arụ Jesu Kristi n’uka. (Eph V,32).
516. Ked’ife ag’eme tupu di na nwunye anụlụ onwe fa?
Fa g’ayọgodu Chukwu, nalụ ndụmọdụ nna fa na nne fa na nke Ụkọ-Chukwu fa, ka fa wee mata ma ha g’anụ pụkwo di.
517. Kedu uche fa g’eji bụ ndị jeko anụ onwe fa?
Fa g’akwadebe na fa g’efe Chukwu ọfụma n’anụmdi fa. Fa g’an’enyelu onwe fa aka na nkpa ha ka nk’arụ ka nke nkpụlobi.
518. O kwesili ka ndị jeko inụ di jụa ajụjụ mak’omume onwe fa ka?
E ye, o kwesili, makana ka fa wenwego aṅụlị, ọ di mma ka fa malụ ụdị onwe fa n’omume onwe fa azị.
519. Ked’ife fa g’an;eme bụ ndị banyelu onwe fa wee lue n’oge fa g’eji nata Matrimony?
Fa g’ebi beha, ghalụ imelu onwe fa, ka fa ghalụ ịdọpụta ọpịpịa Chukwu.
520. Kedu nkwadebe ag’akwadebe iji nata Sacrament nke Matrimony ọfụma?
Di na nwunye g’anọ n’ọkwa gratịa siten’ikwpuputa njọ fa.
521. Ndị bu njọ ogbugbu n’obi wee nata Sacrament nke Matimony, fa natakwọlụ gratịa ya ka?
Mba, fa melu njọ ịlụ ife dị asọ, fa dọkpụtalụ onwe fa ọpịpịa Chukwu kama Ngọzị.