MAKA ORDERS DỊ ASỌ
MAKA ORDERS DỊ ASỌ
505. Gịnị bụ Orders dị asọ?
Orders dị asọ bụ Sacrament an’eji echi ndị Bishop na ndị Ụkọ-Chukwu nandị Ofufe ọzọ nke Nzụkọ, fa esi n’ya nata ike na gratịa iji wee g’alụ ọlụ fa dị asọ.
506. Ọ bụ siten’aka nk’onye ka ndịỤkọ-Chukwu si nata ike iji wen’alụga ọlụ fa dị asọ?
Ọ bụ n’aka nke Jesu Kristi ka ndị Apostle natalụ ike a o wee si n’aka fa felu ndi Bishop felu ndị Ụkọ-Chukwu na ndi Ofufe ọzọ. N ofu k’ọ g’esididide ganye n’isinjedebe nk’ụwa.
507. One ndi k’ọ dịlị bụ inye Sacrament nke Orders dị aso?
Ọ bụ sọsọ ezi Bishop bụ onye ọ dịlị’inyenu.
508. Maka gịnị k’i ji sị n’ọ bu sọ ezi Bishop bụ onye ọ dịlị inye Sacrament nke Orders dị asọ?
Ọ bụ makana Bishop asị apụrọ inye ya, dịka Bishop nke ndị Protestant ga.
509. Maka gịnị k’ị ji sị na Bishop nke ndị Protestant bụ Bishop asị?
Ọ bụ makana fa chili siten’usolo ‘Edward’ nk’isi m’ọ bụrọkwọ n’ike nke ndị Apostle. (Ne n’akwụ-kwọ nk’a nakpọ ‘Common Prayer: Articles of religion, XXXVI).
510. Eze na Ndị ‘Paliament’ e’nwelu nwa ike ido iwu ichi Ụkọ-Chukwu mọbụ Bishop ka?
Mba, makana ‘Paul’ dị asọ sị: N’o nwerọ mmadụ Pụlụnụ iwel’ike n’onw’ya ma belụsọ m’onye akpọlụ, m’ọ bụrọkwọ sitena ndị otu nkịtị,- ma n’ọ bụ sọ sitena Chukwu dika etu esi kpọ ‘Aaron’. (Heb, V,4). (Matth.,14). (Titus, I,5). (2Timothy, 16). (Acts XIII,3).
511. Kedu afa ọlụ dị na sacrament nke Orders dị asọ n’enye ndị Ụkọ-Chukwu ike ịlụnụ?
Ndị bụga isi bụ: ike ịchụ aja Mass, ịgbaghalụ njọga n’inye Sacrament ọzọga, ikwuputa ozi-ọma, n’ike ịkuzili mba.
512. Ked’ife bụga isi ife achọlụ n’aka ndi jeko ịnata Orders dị asọ ka fa mee?
Chukwu g’akpọgodu fa, fa tinye obi fa n’otito nke Chukwu, n’anw’azi oko fa izọ
nkpụlobi madụga, fa ghalụ mmefie na ndụ fa.
513. Ked’ọlụ ndi otu Chukwu n’ebe Ụkọ-Chukwu fa nọ?
Ndị otu Chukwu g’an’asọpụlụ ndị Ụkọ-Chukwu dịka ndị odibo nke Jesu Kristi, n’ayọazili fa ayịyọ.