MAKA EXTREME UNCTION
MAKA EXTREME UNCTION
500. Gịnị bụ Extreme Unction?
Extreme Unction bụ Sacrament an’esite n’ya ete onye ọya ude dị asọ, na siten’ayịyọ nk Ụkọ-Chukwu ọ nata gratịa nke Jesu Kristi maka ọdi mma nke nkpụlobi ka nk’arụ ya.
501. Ked’ekpo eji enye Extreme Unction?
Ekpo eji enye Extreme Unction bụ ma atụbal’anyị uche ọnwụ siten’ọya.
502. Ked’ife ọ n’emedu bụ Sacrament nke Extreme Unction?
Ife ọ n’eme bụ Sacrament nke Extreme Unction bụ n’ọ n’akasi nkpụlobi, n’enye ike, ọn’agbaghalụ njọ n’azọazị onye ọya ma Chukwu neya n’ọ dị mma.
503. Ked ife anyị nwedulu n’akwụkwọ dị asọ maka Sacrament nke Extreme Unction?
Ife dị n’akwụkwọ dị asọ maka Sacrament nke Extreme Unction dị n’isi nke ‘James’ dị asọ ebe o si: O nwelu onye n;aya ọya n’etiti unu, ya kpọbata Ụkọ-Chukwu nke Nzụkọ, ka fa yọ kwasị ya ayịyọ, welu ude wee te ya n’afa nke Chukwu. Ayịyọ nk’okwukwe g’azọ onye ọya: Osebulụwa g’ewenit’ya, ọbụlụ n’ọ nọazị nime njọ ag’agbaghalụ ya fa. (James,V,14,15).
504. Ag’anata Sacrament nke Extreme Unction ugbol’ugbolu ka?
E ye, m’ọbụrọkwọ n’ofu iru ọya.