MAKA INDULGENCE
MAKA INDULGENCE
490. Gịnị bụ indulgence?
Indulgence bụ mgbaghalụ nk’afụfụ dịlị njọ agbaghagalụ agbaghalụ, ag’anata n’ụwa a mọbụ n’ụwa nke g’abianụ, nke Ụkọ-Chukwu n’ebepulu onye njọ nke n’eme ezi ebele.
491. Ụka nwel’ike inye indulgence?
E ye, Jesu Kristị nyel'ya ike a kọ sị ndị Ụmụ’azụ ya; ife unu agbatọpụna n’ụwa ag’atọpụ ya na enuigwe’ (Math, XVIII,18(.
492. Kedu k’ụka ji esi na indulgence nụnwa ebepụ afụfụ dịlị njọ anyị agbaghagalụ agbaghalụ anata n’ụwa a mọbụ n’ụwa nke g’abianụ?
Ọ bụ siten’ịgunyel’anyị mmarị nke Jesu Kristi marị galụ Chukwu, ka nke Virgin Maria ka nke ndị dị asọ.
493. Kedu k'anyị g’esi nwe mbepụ nk’afụfụ dịlị njọ anyị aghaghalụ agbaghalụ sitena mmarịndị ọzọ marịgalụ Chukwu?
Anyị g’enwe ya dịka etu mmadụ si eji ụgwọ, onye ọzọ akwụalụ ya, ọ bụlụ ya bụ n’ụgwọ apụa.
494. Ụzọ indulgence one dị?
Fa dị ụzọ nabọ: indulgence zul’ezi na indulgence n’ezurọ oke.
495. Gịnị bụ indulgence zul’ezu?
Ọ bụ ngụpụ nk’afụfụ nine dịlị njọ.
496. Gịnị bụ ịngbaghalụ n’ezụrọ oke?
Ọ bụ mgbaghalụ nk’afụfụ onwo dịlị njọ anyị.
497. Gịnị k’anyị g’eme wee lita indulgence?
Anyị agharọ ịnọ n’ọkwa gratịa dị asọ, mezue ife nine nk’ụka kal’anyị.
498. Ụka ọn’enyerọ nwa indulgence k’anyị wefugo ụzọ ime njọ?
Mba, nka bụ okwu asị nke ndị Protestant, makana ndị Ụka n’enye indulgence bụ sọ ndị n’akabarụ n’amarị Chukwu siten’ilunyelu ya ọlụ obi ebele.
499. Ọ dị k’aka nwel’ike inye indulgence maka ndị nọ na Purgatory ka?
E ye, m’ọbụlụ n’ụka ekwe k’ọ dịlị nkpụlobi ndi nọ na Purgatory.