MAKA MMARI MỌBỤ ỌPỊPỊA
MAKA MMARI MỌBỤ ỌPỊPỊA
478. Gịnị bụ mmarị?
Mmarị bụ imezi ife anyị mefielu Chukwu mọbụ mmadụ ib’anyị.
479. Okwesili n’anyị g’amarigodu Chukwu maọbụ mmadụ ibe anyị ife anyị mefielu fa k’anyị bịana g’enwe mgbaghalụ njọ?
E ye, makan’ọ bụlụ n’anyị akwadeberọ ime ọpịpịa n’ime obi anyị, n’o nwerọ k’anyị genwe mgbaghalụ njọ na Sacrement nke Penance.
480. Chukwu, bụ onye n’agbụsịlị anyị njọ na Sacrament nke Penance ọ d’agbụsịsịazị ụfụ n’adịlị njọ?
Chukwu n’agbụsịsị pụl’anyị ụfụ ebebe dịlụ njọ ogbugbu anyị megalụ, m’ya bụlụ sọ n’ụzọ nka; m’anyị kwelu ita afụfụ mọbụ lie ụfụ nwelu njedebe n’ụwa nka mọbụ n’ụwa nke gabianụ (Acts, XXVI, 20; Luk.111,8).
481. Jesu Kristi atasịrọgolulị anyị afụfụ njọ anyị iji marị Chukwu maka ikpe-nkwụmọtọ
ya?
Eye, ọ tasịgol’anyị afụfụ maka njọ anyị, na ụfụ nk’afụfụ a g’abakwabalụ sọ ndị nine g’anwazị oko fa ịta afụfụ maka njọ fa siten’ilụ ọlụ nk’ebele.(Lau,111,8).
482. Ọ bụrọ imekata Jesu obi bụ ịlụkwasị ọlụ nk’ebele wee kwasị na mmarị nke nyanwa, bụ Jesu Kristi?
Mba, makan’ọ bụ ndịa bụ mmịmị nke mmarị Jesu Kristi marịlị, na makana siten ya ka fa ji wee ba n’ife.
483. Ụzọ mmari one dị?
Fa dị ụzọ nabọ: mmarị nke Sacrement na mmarị nk’aka onye.
484. Kedugadụ mmarị nke Sacrament?
Bụ ọlụ n’afụga ụfụ ụkọ-Chukwu n’akalụ onye njọ k’ọ lụa.
485. Kedugadụ mmarị nk’ak’onye?
Fa bụga ọlụ n’afụ ụfụ nk’anyi ji aka anyị wee lụ n’onw’anyị, mọbụ ụfụ afụfụ anyị rubel’isi wee n’alụ n’aka Chukwu mọbụ n’aka mmadụ ib’anyi.
486. Ọ bụ iwu n’anyị agharọ ime ọpịpịa Ụkọ-Chukwu nyel’anyị na nkwuputa?
E ye, makan’ ọ lọnyelụ bụlụ akala nke Sacrament Penance.
487. Kedu k’anyị g’esi mee ọpịpịa anyị?
K’anyị g’esi mee ọpịpịa anyị bụ n’anyị g’emekpugbado ya, n’oge nụ akal’anyị ime ya, bụlụ n’uche ezie n’ọbụ iji ya marị Chukwu.
488. Anyị g’marịt’azị Chukwu sitena mmarị nk’ak’onye?
E ye, dịka akwụkwọ dị asọ si kwu; Tọpụnụ njọ unu siten’imelu ogbenye ọgọ, n’ajọ ife unu megalụ siten’ilụ ezi ọlụ ebele.(Dan, IV 24).
489. Kedu k’anyị g’esi marị mmadu ib’anyị?
- Siten’imezi ajọ ife nụ anyị melu ya;
- Siten’ikpọzị ezi afa ya m’anyi kpọbie ya;
- Siten’idokwa okwu dị n’agbat’anyị na ndị ilo anyị.
- Siten’ịtọzị aj'ụkpụlụ anyị tọgalụ.