MAKA MGBAGHALỤ NJỌ
MAKA MGBAGHALỤ NJỌ
474. Gịnị bụmgbaghalụ njọ?
Mgbaghalụ njọ bụ ntọrapụ nke Ụkọ-Chukwu n’atọrapụ n’afa nke Jesu Kristi, nke ọ n’ejiazi agbụsisi njọ ndi nine melu ezi ebele.
475. Ụkọ-Chukwu g’enyekwọ ndị nine mgbaghalụ njọ?
Mba, Ụkọ-Chukwu n’ajuazị ịgbaghalụ; nke mbụ ndị nine njọ malụ arụ; nk’ibụa bụazi ndị nine n’achọrọ ịrapụ ụzọ nine nke njọ fa, n akpachal’anya n’eme njọ, nk’itọbụlụ ndị g’ajụ ịmarị Chukwu mọbụ mezielu mmadụ ibe fa mak’ife fa mefielu fa; nk’inọ bụlụ ndị n’amakporo ezi okwu nke Nzụkọ mmadụ ji anapụga.
476. Ọ dị ka mmadụ nine natalụntọrapụ nke njọ n’aka Ụkọ-Chukwu natazulu mgbaghalụ ka?
Mba, ọ bụ sọ ndị nine natalụ ntọrapụ n’ezi obi.
477. Ọ bụlụ n’onye nlọgha anatarọ ntọrapụ na nkwuputa ikpeazụ ya ked’ife ọ g’eme ma ọ bụlụ n’ojekwulu Ụkọ-Chukwu ọzọ na nkwuputa?
Ọ g’ebidonwo nkwuputa ya, kwuazị n’ya anatarọ ntọrapụ na nkwuputa ikpeazụ ya, n’ife kpatalụnụ ya ejirọ nata ntọrapụ.