ỤZỌ ISI JEE NKWUPUTA
ỤZỌ ISI JEE NKWUPUTA
462. Ked’ife anyi g’eme iji wekwadebe onw’anyi ịnata Sacrament nke Penance?
Ife anyi g’eme iji wekwadebe onw’anyi ịnata sacrament nke Penance bụ:
- Anyi g’akpọkue Mmụọ-nsọ;
- Anyi enyochaba akọ-nuche anyi;
- Anyi elogha n’obi anyi maka achọmokwu anyi chọlụ Chukwu, we kwadebe s’ike imezi nk’ọdị n’iru.
463. Gịnị bụ inyocha akọ-n’uche anyi?
Ọ bụ ichọ njọ nụga anyi melu eri anyi ji wejesi nkwuputa Ikpeazụ, k’anyi, wekpọgo fa asị, kwuputa fa, we nwe mgbaghalụ fa.
464. Na gịnịdụ k’anyi g’enyocha akọ-n’uche anyi?
Ọ bụ n’iwu nke Chukwu, n’iwu nk’ụka, ya n’isi njọ isa, ya na njọ anyi Kpatalụ mmadụ ib’anyi k’o me mọbụ njọ anyi nwel’ike ịnata m’anyi anararọzi, n ọlụ dịl’anyi n’ọkwa ọbụna anyi anọna, na njọ nụ nk’anyi n’emega ugbo-I’ugbolu.
465. Ked’ife anyi g’en’emegadụ m’anyi nyochaba akọ n’uche anyi?
Anyi g’akabarụ malụ ugbol’one anyi melụ njọ abụna njọ, malu afa faga, n’ụzọ anyi si mee fa, malụ ife na-akpat’ya bụ nnukwu njọ ga,bụ njọ anyi melu siten’ilolo, n’okwu, n’izuzu, n’omume.
466. Ked’ife an’eme m’enyochasia akọ-n’uche?
Anyi g’eme ebele n’obi anyi, wekwadebe nọ s’ike imeghalị nk’ọ dị n iru.
467. Anyi mesia ebele ked’ife ag’emedu?
Anyi g’eje n’iru Ụkọ-Chukwu, sekpul’ani, mee akala nk’obe, yọ Ụkọ-Chukwu, ngọzi si: biko nna, gọzie m n’emegom njọ.
468. Anastasia ngọzi ked’ife onye bialụ nkwuputa g’ekwu?
Ọ g’esi nọnwọ gụa: ‘Ekwuputam’ gwa Chukwu’….Etc, kwụsi na site na mmefie m kasi nnukwu, bia kwue k’o tetal’aka bụ eri nkwuput'ya ikpeazụ, kwuazi m’o melu ọpipia ya, ya na m’o natalu mgbaghalụ njọ.
469. Ked’ife ọ g’eme m’emesia nka?
O welu um’ani kwugbado njọ ya.
470. Gịnị k’ag’eme m’ekwuputasia njọ?
Ekwuputasia njọ agụgbado ‘ekwuputam’ gwa Chukwu’ agunyel’ọlụ, bia gukwasiazi ayiyọ: Njọ nine ndia na njọ nine ndị ọzọ…. Etc;.
471. Agụsia ayiyọ ndịa, gịnị k’ag’ emekwazi ọzọ?
Ọ g’edolu arụ anị gebezịa ntị na ndụmọdụ nk’Ụkọ-Chukwu g’adụ ya, bia malụazi ọpịpịa nk’ọ g’akal’ya bịa chebe n’ebele weganye ekpo ọ g’eji nwe mgbaghalụ njọ.
472. Ked’ife ọ fọdụlụ imenu ma Ụkọ-Chukwu nyesịa mgbaghalụ njọ?
Onye bialụ nkwuputa g’echighakwọn’ọnọdụ ya kenebe Chukwu maka mgbaghalụ ọgbaghalụ ya, webia kwadebe onw’ya na ya g’ emezi nk’ọ dị n’iru mee ọpịpịa ọsịsọ ekpo o jina fụ efe.
473. Ọ bụlụ n’Ụkọ-Chukwu ajụ inye mgbaghalụ gịnịzị k’onye bịalụ nkwuputa g'eme?
Ọ g’ewedata onw’ya n’umeani, mezibe ndụ ya k’o wee nwego ike inata mgbaghalụ mbọsi ọzọ.