MAKA NKWUPUTA
MAKA NKWUPUTA
450. GịNị bụ nkwuputa?
Nkwuputa bụ ịtọ onw’anyi na njọ nine anyi melu gwa Ụkọ-Chukwu k’anyi wee nwe mgbaghalụ nke njọ.
451. Onye rabalụ nkwuputa?
Ọ bụ Jesu Kristi n’onw’ya k’o dolu Sacrament nke Penance sị ndi Apostle: ‘Njọ ndị unu gbaghalụ agbagh-alugo fa, ma njọ ndị unu radolu aradago fa. (John,XX,28).
452. Kedu k’okwu nke Jesu Kristi afụ si gosifụ n’ag’ana ekwuputa njọ gwa Ụkọ-Chukwu
k’ewe nwego mgbaghalụ ya?
Okwu Jesu Kristi afụga gosili n’echigo ndi Ụkọ-Chukwu ndị ikpe nk’akọ-n’ucheụ mmadụ; ma k’echili fa ndi afụ, fa am’ekpeta ọfụma belụsọ m’onye njọ ji ọnụ ya we kwuputa k’ya si me fa.
453. Ọ bụ ife dị mma n’ag’ekwuputagbado njọ nine?
Eye, anyi agharọ idi n’ekwuputagbado njọ ogbugbu nine emegalu k’anatasịlị baptism.
454. Gịnị melu ag’eji n’ekwuputagbado njọ ogbugbu nine?
Ọ bụ makana anyi am’enwe mgbaghalụ m’anyi zobe njọ ogbugbu ọbụna.
455. Gịṅị k’o melu bụ onye kpachal’anya zobe njọ ogbugbu na nkwuput’ya maka egwu mọbụ ifele?
O mebigbadolu nkwuput’ya mee nnukwu njọ ilu ife di asọ, n’ọgwalụ Mmụọ-nsọ okwu asị, bia mebie Sacramentalụ.
456. Ked’ife o g’eme bụ onye kpachal’anya zobe njọ ogbugbu na nkwuput’ya nke gbo?
Onye afu g’ejenwokwa nkwuputa, kwuputekwazi njọ nine nke gbo.
457. O melu ajọ nkwuputa, bụ onye lozolu ofu njọ ogbugbu m ya eburọ na uch’ya izo ya ka?
Mba, o merọ ajọ nkwuputa, nkwuputa ya di mma, m’ọga ekwuputa njọ afụ m’o je nkwuputa ọzọ.
458. Ọ bụ iwu n’anyi agharọ ikwuputagbado njọ di mgbahalụ?
Mba, ọ bụrọkwọ iwu, m ọ bụ ife di mma m’anyi kwuputagbado fa; mbụ o ji dị mma bụ, makan’o nwelu njọ ogbugbu ụfọdụ anyi n’eleanya n’ọ bu njọ dị mgbaghalụ, m’ya abụrọ; ọzọkwazi bụ, makana Sacrament nke Penance n’enye narị ndụ nke nkpụlobi anyi ike.
459. Kedu ka nkwuputa g’esigadụ o wedi mma?
Nkwuputa g’adị nke-nke, dị um’ani, dị nye n’anya ya, bụlụ ezigbo, zue oke.
460. Gịnị bụ nkwuputa kasịnụ?
Nkwuputa kasinu bu ikwunwota njọ nk’ị kwuputagoluli mọbụ nke ndụ nine mọbụ nk’arọ one-mone nke ndụ.
461. Ked’ekpo o ji di nkpa bụ ije nkwuputa kasinụ?
Ọ bụ ekpo ị fụlụ na nkwuputa ị gal’aga jọlụ njọ.