MAKA NKWADEBE OBI SIKE NKE IMEGHALỊ NKEỌDỊ 'N'IRU
MAKA NKWADEBE OBI SIKE NKE IMEGHALỊ NKEỌDỊ 'N'IRU
445. Gịnị bụ ịkwadebe obi s’ike nk’imeghalị nk’ọ dị n’iru
Ọ bụ ikwadebe obi anyi s’ike kelu ọ bụrọkwọ sọ n’ezelu njọ m’ọ bụazi k’ife nine n’akpat’ya bụ njọ.
446. Kedu k’ịkwadebe s’ike a nke ịmeghalị nk’ọ dị n’iru gesi dị?
Ọ g’abụ nk’ezigbo, s’ike, dị ile.
447. Ked’ife bụ n’og’abụ ezigbo?
Isi ya bụ n’onye njọ g’akwadebe obi ya ezie ịzelu njọ n’ife nine n’edub’ya na njọ.
448. Ked’ife bụ n’ọ g’esi ike?
Isi ya bụ n’onye njọ g’akwadebe ịkwụ s’ike na n’ikwu nnega sigal’ike, ralụ ita afụfụ kama ime njọ.
449. Ked’ife bụ n’ọ g’adi ile?
Isi ya bụ n’onye njọ g’akwadebe obi ya inwasi okoya ike izelu njọ.