MAK’EBELE
MAK’EBELE
436. Gịnị bụ ebele?
Ife bụ ebele bụ obi mgbawa, n’ikpọ njọ asị, n’ịkwa ụta maka achọmokwu anyi chọlụ Chukwu, nọdụ ya kelu imeghali nk’ọ dị n’iru, bia mari ikpe nkwụmọtọ nke Chukwu.
437. Kedu K’anyi g’esi g’anata ezi ebele maka njọ anyi?
K’anyi g’esi g’anata ezi ebele maka njọ anyi bụ siten iyọ ezi ayiyọ mak’ya na siten ilo ilolo nu geduzi anyi n’ya.
438. Ked’ilolo maka Chukwu anyi g’elog’eduzi anyi n’ime njọ anyi?
Ilolo nụnwa maka Chukwu g’eduzi anyi n’ime ebele maka njọ anyi: m’anyi lo na sitena njọ anyi k’anyi ji wechọ Chukwu okwu onye afọma ya n’enwerọ mgbo n’Onw’ya, nk’on’enwe mgbo n’ebe anyi nọ.
439. Ked ‘ilolo maka Onye-nzọpụta anyi anyi g’elo g’eduzi anyi n’ime ebele maka njọ anyi?
Ilolo nụnwa maka Onye-nzopụta anyi g’eduzi anyi ime ebele maka njọ anyi: m’anyi lo n’Onyezọpụta anyi nwụlụ maka njọ anyi , na ndị nine n’eme ajọ njọ kpọgbunyelu n’onwefa Nwa nke Chukwu, n’em’yak’ọbụlụ akaja.
440. Ụzọ ebele onee di?
Fa dị ụzọ ebele nabọ; ebele zul’ezu n’ebele n’ezusirọ oke.
441. Gịnị bụ ebele zul’ezu?
Ebele zul’ezu bụ ebele maka njọ anyi sikwaba sọ n’ifụnanya nke Chukwu pụta.
442. Gịnị bụ ebele n’ezusịrọ oke?
Ebele n’ezusịrọ oke bu ebele n’eme k’ob’ ịkpọ njọ asị, nke emelu sitena njọ nke mọbụ siten’itu egwu ọpịpịa nke Chukwu, kelu imeghalị nk’ọ dị n’iru nọ-duaziya marị ya maka ikpekwumọtọ.
443. Ked’ife ebele zul’ezu n’alụ?
Onye njọ ji ya enwe mgbaghalụ m’ya ak’ejerọ nkwuputa, m’ya agharọ inwe agụ ije nkwupụta ekpo o jina nwe efe.
444. Ked’ife ebele n’ezurọ oke n’alụ?
Ife ebele n’ezusịrọ oke n’alụ bụ n’ọ n’agbahalụ njọ sọsọ site n’ike ntọrapụ.