MAKA PENANCE
MAKA PENANCE
431. Gịnị bụ Penance?
Penance bụ Sacrament anyi n’esi n’ ya anata mgbaghalụ njọ anyi melu k’ anyi natasili Baptism.
432. Ked’ ekpo Osebuluwa anyi ji wedo Sacrament nke Penance?
Ekpo Osebuluwa anyi ji wedo Sacrament nke Penance bụ k’ ọ fụwụsalụ ndi Apostle ụfụlu, nye fa
Ike igba ghalụ njọ sị: ‘Nalụnụ Mmụọ nsọ, njọ abụna njọ nk’ onye ọbụna unu
agbatọpụna ag’ agbatọpụ fa, ma njọ abụna njọ nk’onye ọbụna unu akwụbana ag’ akwudobe fa’
(John, XX, 22, 23).
433. kedu ndi bụ ndi nụ sitelu n’ okwu ndia nke Jesu Kristi wee nwe ike iji n’ agbatọpụ mọbụ n’
akwudobe njọga?
Fa bụ ndi Ụkọ-Chukwu nine natalụ ike n’ aka Bishop.
434. Sacrament nke Penance g’ an’ ekpo mmadu ekpo inatanu?
E ye, ọ bụ ndi nine melu njọ ogbugbu, ka fa natasili Baptism, ka Sacrament nke Penance g’ an’
Ekpo ịnatanụ.
435. Kedugadu ife bụ ife n’ ekpoga ekpo achọlụ n’ aka mmadu k’ ome wee nata Sacrament nke
Penance?
Ife achọgalụ n’ ekpo ekpo iji we nata Sacrament nụnwa bụ, ebeble, nkwuputa, na ime ọpipia
(mọbụ mmari).