MAK’ IKPE
125. Ked’ ekpo ag’ eji kpe nkpụrụobi anyị ikpe?
Ọ bụ m’ anyi nwụrafụ.
126. Gịnị bụga ife Chukwu g’ ekpe n’ ikpe?
Chukwu g’ ekpe iluloga, n’ okwuga n’ ọrụga nife aragalụ omume.
127. Ekpesịa ikpe aka- nkpa an’ ekpe mmadụ nine n’ ofu n’ ofu ma fa nwụraafụ, ọ nwelụ ikpe ọzọ g’ adinụ?
Eye, ikpe afụ g’ adịnụ bụ ikpe ọra nine.
128. Ked’ ife Kristi g’ agwa ndị njọ?
Ife Kristi g’ agwa ndị njọ bụ: pụbalụ nụ m’ nu ndị abụr’ ọnụ, gaba’ nụ n’ ọkụ ebebe eji ma ekwensu na n dị ozi ya wekpọnwụ.
129. Ked’ ife Kristi g’ agwa ndị ọma?
Ife Kristi g’ agwa ndị ọma bụ: bịa nụ ndị dị ngọzị nke Nna m g’ nwelụzia nụ anịeze akwadebelụ unu.