MAK’ ỌNWỤ
120. Gịnị bụ ọnwụ?
Ọnwụ bụ ọpụpụ nkpụrụobi n’ esi n’ arụ mmadụ apụ.
121. Ọ bụ iwu na mmadụ nine g’ anwụ ka?
Eye, Chukwu arabagoka mmadụ nine ịnwụ ọnwụ ka Adam mesịrịnjọ.
122. Ked’ ekpo anyi g’ eji g’ anwụ?
Onye Ọbụna amarọ, ọ bụ sọ Chukwu ma.
123. Ked’ ife anyị g’ eme k’ anyi wee nwụọ ezigbo ọnwuụ?
Anyi g’ en’ ebi obi ezi onye otu Chukwu n’ ụwa k’ anyị dị ndụ.
124. Gịnị g’ eme anyị m’ anyị nwụọ?
Ekpo anyị g’ anwụrụ arụ anyị eree ure mkpụrụobi anyị agaa n’ iru Chukwu ag’ kpe ya ikpe.