OK’ ISII NK’ OKWUKWE
115. Kedu nke bụ ok’ isii nk’ okwukwe?
Ok’ isii nk’ okwukwe bụ : Ọrọgolụ n’ enuigwe, ọ nọdụ n’ aka nni Chukwu Nna, onye pụrụ ime ife nine.
116. Ked’ isi ife bụ : ọrọgolụ n’ enuigwe?
Is’ ife bụ ọrọgolụ n’ enuigwe bụ, n’ onyenzọpụta anyị ji arụ na nkpụrụobi ya wee rọgolụ n’ enuigwe na mbọsị “Ascension”, k’ ọ dị n’ ọgụ nkpụrụ ụbọsị nabọ o si n’ ọnwụ binitesịa.
117. Ked’ isi ife bụ ọ nọdụ n’ aka nni Chukwu nna?
Isi ife bụ ọnọdụ n’ aka nni Chukwu Nna, abụrọkwa na Chukwu nwer’ aka makan’ ọ bụ mmụọ, m’ ọ bụ makana Kristi na Nna ra nranya nk’ o ji bụrụ Chukwu, abịana nke o ji bụrụ mmadụ ọ n’ ọdụ n’ ọkwa karịsịrị ọkwa n’ enuigwe.