OK’ ISE NK’ OKWUKWE
119. Kedu nke bụ ok’ ise nk’ okwukwe?
Ok’ ise nk’ okwukwe bụ: o zida na mmụọ n’ ụbọsi nk’ ịtọ sikwa na ndị nwụrụ anwụ pụta
110. Ked’ isi ife bụ: o zida na mmụọ?
Isi ife bụ o zida na mmụọ bụ ka Kristi nwụchara, nkpụrụobi ya dị ngọzi jebe n’ ebe an’ akpọ Limbo.
111. Ked’ isi ife bụ Limbo?
Isi ife bụ Limbo bụ ebe ozuzu ike, ebe an’ edebe nkpụrụobi ndị ọma nwụrụnụ tupu amụọ Kristi.
112. Gịnị kpatalụ eji edebe nkpụruobi ndị ọma na Limbo?
Ifeji edebe nkpụrụobi ndị ọma na Limbo bụ makana fa amaragolufu n’ ukpo-eze nk’ enuigwe na Kristi emeghe rolu fay a
113. Ked’ isi ife bu: n’ ụbọsi nk’ itọ o sikwa na ndị nwụrụ- anwụ pụta?
Isi fe bụ n’ ụbọsi nk’ itọ o sikwa na ndị nwụrụ’ anwụ pụta bụ, ka Kristi nwụsịri, enie ya, ka nkpụrụ ụbọsị ịtọ gasịrị, o tutekwa arụ ya dị ngozi, na na ụzọ ụtụtụ ụbọsị nk’ịtọ.
114. Kedu mbọsị Kristi si n’ ọnwụ binite?
Kristi si n’ ọnwụ binite na mbọsị Iista (Easter).