MAKA ONYE OTU KRISTI
113. Onye bu Onye otu Kristi?
Onye otu Kristi bụ onye abaptiziri nke kwere n’ emepụta n’ omume ya nkuzi nine nke Jesu Kristi.
114. Onye ọbụna na achọ nzọputa ọgabụ’ onye-otu Kristi ka?
Eye, onye ọbụna g’ achọ nzọpụta ga bụ onye otu Kristi
115. Kedu akara- nji mara nk’ onye otu Kristi?
Ọ bụ akara nk’ obe.
116. Kedu k’ esi adụ akara nk’ obe?
An’ adụ akara nk’ obe site na ịdụ aka nni n’ egedeg’ iru, si ya wedata n’ obi. Si n’ obi wega ya n’ ubu ak’ ekpe, bịa wefeta ya n’ ubu aka nni, si : N’ afa Nna na Nwa na Mmụọ- nsọ Amen.
117. Mak g’ nị k’ anyi ji adụ akara nk’ obe?
Ife anyi ji adụ akara nk’ obe bụ:
- K’ anyị wen’ echeta maka itọ-Nime’ ofu dị ngozi
- K’ anyi wenecheta na chukwu Nwa nwụrụ mak’ anyi n’ obe
118. Kedu mgbe anyị g’ eji n’ adụ akara nk’ obe?
Mgbe anyị g’ eji n’ adụ akara nk’ obe bụ, m’ anyị tetasịa ụra, m’ anyi g’ ebido ezi ọrụ, ọbụna, na n’ isi njedebe ya, n’ oge nnega na ekp’ anyi nọdebelụ njọ.