OK’ ỊNỌ NK’ OKWUKWE
101. Kedụ nke bụ ok’ ịnọ nke okwukwe?
Ok’ ịnọ nk’ okwukwe bụ: ọ ta afụfụ n’ oge nke Pọntius Paileeti, akpodo ya n’ obe, ọ nwụọ, enie ya.
102. Kedụga nwa isi afụfụ Kristi talụ?
Isi afufu Kristi talu bu:
103. Afụfụ uche n’ okpofufu mme kpolu ya n’ ogige,
- Ịtalị’ apịal’ ya k’ ekedolu ya n’ ogidi okute, n’ okpu ogwu ekpubel’ ya:
- Obe ya o ji ak’ ya bulu, nkpogbu n’ obe ya, n’ọnwụ ya ọ nwụrụ n’ etiti ndị ori nabọ.
104. Ked’ ife an’ akpọ isi afụfụ Osebụrụwa anyị talụ?
Ife an’ akpọ isi afụfụOsebụrụwa anyi talụ bụ afụfụ nke Jesu Kristi.
105. Maka gịnị ka Jesu Krist ji ta afụfụ?
Ife Jesu KristI ji ta afụfụ bụ k’ ọ wee dokwa maka njọ anyi, k’ ọ wegotal’ anyi ndụ ebebe.
106. Gịnị kpatalụ eji akpọ Jesu Kristi onye- mgbapụta anyi?
Ife eji akpọ Jesu Kristi Onye- mgbapụta anyị bụ makan’ ọbal’ ya dị ok’ ọnụ ka o ji wee gbapụta- anyị.
107. Jesu Kristi ọ nwụrụ maka mmadụ nine ka?
Eye, Jesu Kristi nwụrumaka mmadụ nine.
108. Mmadụ nine, Jesu Krist nwụrụ maka fa, ag’ an’ apuga- kwọ?
Mba, ọ bụ so ndị nine chọlụnụ g’ anapụga.
109. Kedụ, mbọsị Jesu Kristi nwụrụ?
Jesu Kristi nwụrụ mbọsị an’ akpọ ‘’Ezi Fụrayidee’’
110. Ebee ka Jesu Krist nọ wee nwụ?
Jesu Kristi nwụrụ n’ ugwu Kalvarị.
111. Kedu ka Jesu si ta afụfụ wee nwụọ?
Jesu Krist tar’ afụfụ, nwụọ dịka mmadụ, makana nk’ o ji bụrụ Chukwu ọ d’ anwụ anwụ, ma nk’ o ji bụrụ Chukwu afụ, ọ nyelu afụfụ ya n’ ọnwụ ya nnukwu ịdị ok’ ọnụ n enwerọ oke.
112. Ked’ isi ife bụ enie ya?
Isi ife bụ enie ya bụ na k’ ọ nwụsịrị, esi n’ obe budata arụ ya, nie ya n’ ini okwute.