MAKA AJA NKE MASS
423. Eucharistia dị ngọzi bụkwaba sọ Sacrament Ka?
Mba, Eucharistia di ngọzi abụkwabarọ sọ Sacrament ọ bụazi aja.
424. Gịnị bụ aja?
Aja bụ ife erunyelu sọsọ Chukwu siten’ aka Ụkọ-Chukwu, k’ ewegosi n’ ya bụ Chukwu n’
Osebuluwa nke ife nine.
425. Gịnị bụ Mass di asọ?
Mass di asọ bụ aja nk’ arụ n’ ọbala nke Jesu Kristi nọ na’ altar’ ezie n’ ụdi achicha na manya,
Erunyelu Chukwu maka ndi dị ndụ na ndi nwụl’ anwụ.
426. Mass dị asọ n aja nk’ obe bụdụ ofu n’ ib’ ya afụ ka?
E ye, makan’ ọ bụ Jesu Krist bụkọdo k’ onye n’ achụ aja k’ if’ eji achụ aja ka n’ enụ obe ka n‘ enu
‘Altar’’.
427. O nwel’ ife di iche nime fa ka?
E ye, o nwelu ife di iche n’ ụzọ esi erunyelu Chukwu ife eji achụ aja; n’ enu obe Jesu Kristi ji
Onw’ ya chụ aja n’ agba mme, abi’ azia n’ enu ‘altar’ o welukwo onw’ya afụ chụbakwo aja ma
siten’ igba-ụko ndi Ụkọ-chukwu, ọd’agbazi mme.
428. Onye k’ an’ achụ aja Mass erunyelu?
Ọ bụ sọsọ Chukwu.
429. Ked’ ife eji mak’ ya achụ aja Mass?
- Inye Chukwu nsọpụlụ, n’ otito kasinụ;
- Iken’ yam aka ọgọ ya nine;
- Inata mgbaghalụ maka njọ anyi;
- Inata gratia na ngọzi ọzọga sitena Jesu Kristi;
430. Kedu ndi Nzụkọ n’ achụlụ aja dị asọ maka ?
Nzụkọ n’ achụ aja dị asọ maka ndi nine dị ndụ na ndi nwụgal’ anwụ.