MAK’ OLILI DỊ ASỌ N’ IFE Ọ N’ ALỤGA NA NKPỤLOBI
408. Gịnị bụ ịnata olili dị asọ?
Ọ bụ inata arụ, n’ọbala na nkpụlobi n’ibu chukwu nke Nna anyi Jesu Kristi nọ n’Eucharistia.
409. Ọ bụl’anyi iwu ịnata olili dị asọ?
E ye, Jesu Kristi tili ya ọ bụlụ iwu sitn’okwu a: ‘Ezie asị m unu; ọ bụlụ n’unu elirọ arụ nke Nwa
nke mmadu, n’ ọ bụlụ n’unu alarọ ọbala ya , unu am’enwe ndụ nim’unu (John,VI,54).
410. Ọ di nkpa bụ ịnata Jesu Kristi n’ụdị achicha na mmanya?
Mba, makan’an’ ana’ azu Jesu Kristi n’ofu ụdị,k’ isi ya, k’ okpol’ya, kesi anatazi n’ib’ya.
411. Ked’ife Sacrament a n’aludu?
1. O n’ewedebe anyi nso na Jesu Kristi;
2. O n’abawanye ndu nke gratia
3. O n’emenyuta oliwalawala agụ nke njọ.
4. O bia nye anyi mbe nke ndu ebebe.
412. O dị ka Eucharistia n’emega ife ndia anyi gulu nwọ mgbencha?
Mba ndi ọ n’emelụ ya bụ sọ ndi natalụ Eucharisti. a dị asọ ọfụma
413. Ndi n’anata Eucharistia dị asọ n’eto eto fa n’anatakwo Jesu Kristi?
E ye, fa n’anat’ya, ma ife o mezili buna fa natalụ ya n’amamikpe nke fa.
414. Gịnị k’ akwụkwọ dị asọ kwulu maka ndi n’ anata olili dị asọ n’eto eto?
Onye Apostle, Paul di asọ, kwulu: Onye ọbuna g’ eli achicha, mọbụ ṅụọ iko nk’ O sebuluwa n’
eto eto, n’ eme k’ ikpe arụ n’ ọbala nke Jesu Kristi ma ya.
415. Kedu ndi melu k’ ikpe ajọ njọ a ma fa?
Fa bụ ndi nine natalụ olili dị asọ, ma fa anọrọzi n’ ọkwa gratia.
416. Ked’ ife ị g’ eme k’ ị, wezelu onwe ị na idaba n’ inata arụ n’ ọbala Jesu Kristi n’ eto eto?
Ag’ amakwadebe onwem, tọpụlụ Ụkọ-Chukwu obi m, ya bụ onye ntọrapụ ma bia kpudebe
Eucharistia di asọ ekpo m fụlụ n’ akwadebesigom ọfụma.
417. Kedu nkwadebe i g’ akwadebe k’ o webụlụ n’ i natalụ olili dị asọ ọfụma?
Ọdi ụzọ nkwadebe nabọ nkwadebe nk’ arụ na nkwa-debe nke nkpụlobi.
418. Kedu nkwadebe nk’ aru?
- Im’ eli nni maọbụ laa manya n’ egbu (dika gin, wine, beer) otu hour tupu inata olili di Asọ, Ma inwelu ike ila mmili oge ọbụna tupu inata Olili dị Asọ.
- Ikpudebe Eucharistia dị asọ na nnukwu obi dị asọ na nsọpụlụ.
419. Onwelu ekpo ag’ eji kwe onyeọbụna k’ ọnalụ Olili di Asọ n’ ebu ọnụ?
Eye, onye ọya nwelu ike ila ife ọlila na adaghi egbu egbu mọbụ lie ọgwu ọbụna oge ọbụna tupu
ọ nata olili dị asọ.
420. Kedu nkwadebe nke nkpụlobi?
Ọ bụ ịdị ọcha nke nkpụlobi n’ ayiyọ nk’ obi.
421. Kedu ife bụ ịdị ọcha nke nkpụlobi?
Ịdị ọcha nke nkpụlobi bụ ịnọ n’ ọkwa gratia, nka bụ onye afụ aghalu ibu njọ ogbugbu nim’obi.
422 Gịnị bụ ayiyọ nk’ obi?
Ayiyọ nk’ obi bụ inwe ezi okwukwe na nchekwube, n’ ifunanya, n’ esekpu, n’ um’ ani n’ ebele, n’
Izuzu.