MAKA VEEJIN MARỊA
84. Veejin Marịa dị asọ ọbụ nne nke Chukwu ezie ka?
Eye, ọ bụ nne nke Chukwu ezie, makan’ya bụ nne Jesu Kristị onye bu Chukwu.
85. Ọ bụ ụdị nke Chukwu ka Marịa mụrụ Jesu Kristi ka?
Mba, ọ bụrọkwa n’ ụdị nke Chukwu k’ọ mụrụ ya.
86. Kedu k’isi kwuo sị na Veejin Marịa bụ nne nke Chukwu?
Agam’ ekwu na Veejin Marịa bụ nne nke Chukwu makana Jesu Kristi adịrọ pesịn nabụọ, ma n’ ọ bụ so’ fu, ya bụ na Marịa, onye bụ nne Jesu Kristị, kwesịazịrịịbụ nne ofu pesịn ọ mụrụ.
87. Kọken’ ya ọfụma?
Pesịn nk’ ịbụa nk’itọ- Nim’ofu dị ngozi, bụ Okwu, melụ onw’ ya k’ ọ bụrụ mmadụ siten’ iweren’ onw’ ya ụdị nke mmadụ, k’ ọ bụrụ nk’ ya; meazị k’ ewenite omume nk’ ụdị afụ ka fa ralụ n’ ịba n’ ifedịk’ omume nk’ onw’ ya .Pesịn nk’ ịbụa nụnwa, nke welụ ụdị mmadụ,bụPesin nke Jesu Kristi; ọ bụ pesịn nke ka Veejin Marịa bụ nne ya. Ya bụ n’ ọ bụ nne nke Chukwu, bụ Marịa.
88. Ọ bụrụ na Veejin Marịa abụrọ nne nke Chukwu gịnị ak’ emezi?
If ak’ eme bụ na Kristi ak’ abụrọzi Chukwu, ọ bụrụ sọ mmadụ, mọbụ na Kristi naganadị pesịn nabọ: ofu abụrụ Chukwu, ofu abụrụazi mmadụ.
89. Ọ bụrụ na Marịa abụrọzi nne nke Chukwu, ked’ ife ị g’ afukwasị nim’ya?
- Ọ bụrụ na Jesu Kristi abụrọ Chukwu, kedụ ka nwa nke Chukwu si gbapụt’ anyị siten’ ọnwụ ya?
- Ọ bụrụ na Jesu Kristi dị pesịn nabọ, kedụ pesịn nime fan abọ nke kwụrụ Chukwu ụgwọ maka nzọpụta anyị? Ọ bụrọkwa pesịn nke Chukwu nke n’ adata afụfụ nke ọ n’ anwụ anwụ: ọ bụrọzịkwa sọ mmadụ nkịtị, onye omume ya bụ sọ omume nkịtị. Yabụ mgab-pụta edirọzi.
90. Ked’ ife i g’ ekwu ma ndị protestantị sịn a Marịa bụ onye ekel’eke, enwerọ ike ịbụ nne nke Chukwu, bụ onye okike?
Asịm n’ okwu a akwudoro, makana Marịa abụrọ nne Nwa nke Chukwu n’ enwe arụ, m’ ọ bụ site na iwo arụ nke Nwa afụ nke Chukwu ko si bụrụ nne nke Chukwu.
91. Veejin Marịa dị ngozi, ọ bụrọ okporo nkịtị dịka ikporo ndị ọzọga?
Mba, ọ bụrọkwa ikporo nkịtị mancha, makana Nwa ya ọ mụrụ bụ Nwa nkeChukwu: nyanwa bụnne dịka Akwụkwọ di asọ si webunie ya n’ otito; na site tata ndụdụgandụ nine gakpọ m onye dị ngozi. (Luk.1.48)
92. Veejin Marịa ọ bụ onye n’ eme njọ dịka ọra nine?
Mba, makana Chukwu ony pụrụ ime ife nine zepụrụ ya ime njọ site na ichekwaba arụ ya mak’ifi nne nke Chukwu Nwa ọ g’ abụ.
93. Ndị Katoliiki an’ esekpuru Veejin Marịa k’ esi esekpuru Chukwu kaa?
Mba makana nka g’ abụ isekpuru arụsị, ma ife fa n’ eme bụn a fa na’sọpụkrịrị ya iche maka nnukwu elele ọ natara n’ aka Chukwu, m ya adị anị agadaga n’ aka nsọpụrụ nke Chukwu, kakwalụ nsọpụr ụ nke ndị Anjelụ na ndị ọzọ dịga asọ.
94. ọ bụ njọ bụ ịdị n ’ ayọ Veejin Marịa ayịyọ k ’ Akwụkwọ dị asọ kwugolu: n ’ ofu Chukwu n ’ ofu onye ogbugbo adịgo n ’ etiti Chukwu Na mmadụ, onye bụ Jesu Kristi?
Mba, ọ bụrọkwa njọ, makana Jesu Kristi bụ onye ogbugbo sọsọ na mgbapụta ọ gbapụtal ụ mmadụ, n’ ya Abụrọkwa sọsọ onye ogbugbo n’ ayịyọ (ife Mkpughe, IV,2-4,-V, 8-10- Akwụkwọ IV ndị eze XIII, 20, 21)
95. Jesu Kristi ebutugo nne ya anị na nzụzọ mọbụ n’ iru ọra ka ndị protestantị si kwu?
Mba, ọ nwenutarọ ekp’ o ji m ya mancha, makan’ ọbụrụ n’ ọfụ, anyi g’ en’ esolu ya butue nne nk’ anyị anị, kwutọba fa.