MAKA EUCHARISTỊ A DỊ ASỌ
393. Gịnị bụ Eucharista di asọ?
Eucharista dị asọ bụ Sacrament nke n’ eluta n’ onw’ ya n’ ezie arụ na mme na nkpụlobi n’ ibụ
Chukwu nke Nna anyi Jesu Kristi di n’ udi achicha na manya.
394. Gịnị mel’ iji sị na Sacrament a bụ ezi arụ n’ ọbala nke Jesu Kristi?
Ọ bu makana Sakrament a bụ ezi arụ Jesu Kristi, nke nọlụ n’afọ Virgin Maria, ofu arụ afụ akpodo
azili n’ obe nọazi n’ otito nk’ enuigwe k’ anyi nọ nwọ.
395. Onye dolu Eucharistia di asọ?
Ọ bụ Jesu Kristi.
396. Kedu k’ anyi si ama n’ ezi arụ n’ ọbala nke Jesu Kristi di n’ Eucharista dị asọ?
Anyi malụ ya n’ elofie elofie siten’ okwu nke Jesu kristi n’ Onw’ ya kwulu k’ o dolu Sacrament
afụ na sitena nkuzi ọdibendi nke Nzụkọ.
397. Kedu nke bụ okwu Jesu Kristi kwulu k’ o dolu Sacrament afụ?
Jesu kristi wel’ achicha gọzie ya nyawa, nye ndi Ụmụ-azụ ya sị fa: ‘Nalụna lie nkea bụ arụ m nk’
agedụlụ nyena ọnwụ mak’ unu: ọ bịa bụlụ iko manya (wine) dị nim’ ya, bunye ndi Ụmụ-azụ ya, si
fa: Nalụnụ la, nka bụ ọbala m nk’ ag’agbalụ unu na imelime mmadụ maka mgbaghalụ nke
njọ.N’emenu nkea na Ncheta nkem.
398. Ked’ ife Jesu Krist melu K’ osi; Nka bụ arụ m’, nka Bu aru m’, nka bu obala m?
O rughalu achicha na mmanya ka fa bụlụ arụ n’ ọbala ya?
399. O nwelu onye Jesu Kristi nyel’ ike irughalu achicha na manya ka fa bụlụ arụ n’ ọbala ya
Eye, Jesu Kristi nyelụ ndi Apostle ya ike’ a; wee sị n’ aka fa felu ndi Ụkọ-Chukwu nke g’
adididenu ganye n’isi-njedebe nk’ ụwa, wee tielu fa iwu iji ike a n’ alụ ọlụ.
400. Ked’ ekpo Jesu Kristi ji nye ike a wee tie iwu ka fa welu ya n’ aga?
Ọ bụ k’ o dosili Sacrament nke Eucharistia di asọ k’ ọ sịlị fa: ‘Neme’ nu nkea na ncheta nke m’.
401. Ked’ ekpo Ụkọ-Chukwu ji erughali achicha na manya ka fa bụlụ arụ n’ ọbala nke Jesu Kristi?
Ọ bụ na Mass dị asọ, ekpo o kwulu okwu odudo di asọ n’ afa nke Jesu Kristi?
402. ked’ ife ụka n’akpọ nrughali nka?
Ụka n’ akpọ ya: Consecration.
- Anyi g’ asigo n’ ọ bụ s’ onyiyo (figure) nke Jesu kristi k’ an’ anata n’ Eucharistia di aso?
Mba nke mbụ bụ, makan’ okwu nke Jesu Kristi n’ onw’ ya elorowo nọfụ: nk’ ibụa bụlụ, makan’ ido nukwu ife di asọ etu a, na Jesu am’ eje g’ atubagodu inu, mọbụ g’ ekwube okwu lọlụ ụzọ ife nabọ.
- I nwekwaisili okwu ọzọ Ị n’ ekwenyerolu ndi protestant n’ okwukwe nke fa maka ụka?
E ye fa Erika; ofu nime fa bụ n’ akwụkwọ nke John di asọ (VL55) Ebe Jesu kwulu si: Arụ m’ bụ ifol’
li ezie ọbala m bụ if’ ọlila ezie’.
403. Oge odudo di asọ gasia, achicha na manya n’ afodulili ka?
Mba, oge odudo di asọ gasia, achicha ad’ abuzikwo achicha, ọ bụlụ arụ Jesu: manya abuzi
Manya, ọ bụlụ ọbala nke Jesu.
404. Ọ bụ sọ arụ Jesu Kristi di n’ ụdi achicha ka?
Mba, ụdi achicha elutarọ s’ arụ Jesu Kristi, m’ ọ bụazi k’ ọbala, ka nkpụlobi k’ ibụ Chukwu Jesu
Kristi bụ n’ adirọ nkewa.
405. Ọ di k’ arụ Jesu Kristi diazi n’ ụdi manya ka?
E ye, Jesu Kristi ka Chukwu ya ka mmadụ ọ bụ nọzu anọzu na ụdi nabọ a.
406. Ụkọ-Chukwu nyawa achicha olili di asọ ọ nyawalụ Jesu Kristi ka?
Mba, ọ bụ s’ ụdi achicha k’ ọnyawalụ, ma Jesu Kristi nọzu anozu n’ ụzọ ibe achicha nabọ a.
407. Ag’ an’ esekpulu Jesu Krsti nọ n’ Eucharistia di asọ esekpulu?
Eye, makana Jesu Kristi bụ Chukwu bụlụ mmadụ nọ anọ ezie n’ Eucharistia.
- Okwu a bụ ezie ka ag; akpogo ya inu ka?
Mba ọ bụrọ inu, makan’ ị sị n’ ọ bụ inu, ife ikpọlụ ezie am’ abụzi ezie.
- Paul di asọ okwuazili mak’ ezi-ọnụnụ nke Jesu Kristi n’ Eucharistia di asọ?
E ye, Paul di asọ kwulu sị: “ Onye obuna g’ eli achicha nka mọbụ la iko nk’ Osebuluwa n’ eto eto, ikpe arụ n’ ọbala nk’ Osebuluwa g’ ama ya?” (I Kor, XI, 27).
- Paul di asọ kwulu sọ mak’ ezi arụ makan’ ọ bụlụ
N’ o lulu n’ ọ bụ s’ onyinyo Jesu Kristi no n’ Eucharistia mọbụ na Jesu anọrọ ya ezie, kezi k’ ikpe arụ n’ ọbala nk’ Osebuluwa g’ esi ma onye natalụ Eucharistia n’ eto eto?