MAKA CONFIRMATION
378. Gịnị bụ Confirmation?
Confirmation bụ sacrament anyi n’ esite n’ ya anata Mmụọ-nsọ, anyi g’ eji webụlụgo ndi
otu-Kristi dị ike kwụazili akwuzu, na ndi ọgụ nke Jesu Kristi.
379. Kedu gratia Confirmation n’ enye nkpụlobi’ anyi?
Ọ n’ enye anyi gratia iji kwudo na nnega nine; iradụ iji kwụlụ chedo nke medidelu okwukwe.
380. Kedụgadụ onyinye nke Mụọ nsọ?
Fa dị ịsa: amamife, nghọta: alo: ike: ọmụma, obi di asọ, n’ egwu nke chukwu.
381. Gịnị bụ onyinye nk’ amamife?
Onyinye nk’ amamife bụ onyinye nke n’ eme anyi k’ anyi Malụ ife nk’ ụwa, chọba ife nk’ enuigwe.
382. Gịnị bụ onyinye nke nghọta?
Onyinye nke nghọta bụ onye nke n’ enye anyi ife n’ obi anyi, Ife n’ obi anyi, me k’ anyi malụ ezi
okwu nke Nzụkọ.
383. Gịnị bụ onyinye nk’ alo?
Onyinye nk’ alo bụ onyinye nke n’ eme anyi k’ anyi nwe nke ịji kpachapụ anya, wechọ werolu ife
bụ kalili ife otito nke Chukwu n’ ife otito nke Chukwu n’ ife nke nnapụga anyi.
384. Gịnị bụ onyinye nk’ ike?
Onyinye nk’ ike bụ onyinye nke n’eme k’ anyi nwe obi ike wemeligbado ife abụna ife’ adichinal’
anyi ụzọ nke napụga anyi.
385. Gịnị bụ onyinye nk’ ọmụma?
Onyinye nk’ ọmụma bụ onyinye nke n’ eme anyi k’ anyi malu ụzọ anyi g’ eso n’ if’ọjọ anyi g’ en’
ezelu, k’ anyi welugo n’enuigwe.
386. Gini bu onyinye nk’ obi di aso?
Onyinye nk’ obi di asọ bụ onyinye nke n’ eme k’ anyi welu obi aṅụli n’ agbaga n’ ife nine bụ if’ ọlụ
nke Chukwu.
387. Gịnị bụ onyinye nk’ obi di asọ?
Onyinye nk’ egwu nke chukwu bụ onyinye nke n’ eme anyi k’anyi n’ atụlụ Chukwu egwụ, n’ afụ ya
n’ anya n’ ezelu ichọ ya okwu.
388. Onye nwel’ ike inye Sacrament nke confirmation?
Ọ bụ Bishop bụ onye ọ dịlị inye Confirmation, ma ebe bishop n’ anọrọ Ụko-Chukwu anata ike n’
aka Pope wee nye.
389. Kedu ka bishop si enyedu Sacrament nke confirmation?
Ka Bishop si enye sacrament nke confirmation bụ, site n’ịyọ ayiyọ ka Chukwu Mmụọ-nsọ dakwasi
ndi jeko inata Confirmation, site azi n’ ibikwasi fa aka, welu ude di asọ me fa akala ‘ obe n’egedeg’
iru, nọdụ-aziya kwue ofu afa okwu.
390. Kedu’ afa okwu an’ ekwu na sacrament nke Confirmation?
Okwu an’ ekwu na Sacrament nke Confirmation diga nwọ:
E mee m ị akala nk’ obe e doo m ị ike site n’ude di asọ nke nzọpụta n’afa Nna, na Nwa, na
Mmụọ-nsọ. Amen.
391. Gịnị melụ Bishop ji ama ndi n’ anata Confirmation ụla na ntị?
Ọ bụ iji kuzili fa ita afụfụ abụn afụfụ, n’ ji wechedo okwukwe Fa.
392. Kedu k’ ag’ esi kwadebe ọfụma ịnata Confirmation?
K’ ag’ esi kwadebe ọfụma inata confirmation bụ:
1. Siten’ ino n’ okwa gratia:
2 .Siten’ imụta nkuzi n’isi if’ omimi nke Nzuko amal’ afa ya;
3. Siten’ ikwadebe mak’ ya siten’ ayiyọ n’ ezi omume