MAKA BAPTISM
367. Gịnị bụ Baptsm?
Baptism bụ Sacrament nke n’ awụchapụ njọ ekel’ ụwa, mee anyi ndi otu-Kristi, n’ ụmụ nke
Chukwu, n’ Otu-Nzụkọ.
368. Baptism n’ agbaghaluazi njo emetal-emeta ka?
Eye, Baptism n’ agbaghalụazi njọ emetal emeta ya n’ afụfụ yan’ ya yi, ma ndi metalụ onwe fa
njọ a welukwọ ezi obi wenat’ ya.
369. Onye bụ onye ọ dili ibaptisi?
Onye ọ dịlị ibaptisi bụ Ụkọ-Chukwu, m’ onye abụna onye g’ abaptisi m’ ọ bia na nkpa m’
Ụkọ- chukwu anọrọ nso.
370. Kedu k’ esi abaptisi?
K’ esi abaptisi bụ si en’ kwọkwasị mmadu mmili n’ isi Nọduazi ya kwue okwu-aga, ‘Abaptisiem’ ị
n’ afa Nna na Nwa na Mmụọ-nso.
371. Ked’ iwu dịlị mmadụ site na baptism?
Iwu dịlị mmadụ site na baptism bụ:
1.Ikwelunu n’ eso nkuzi nine nke Jesu Kristi:
2.Iche nti n’ okwu nke Nne anyi di asọ, bụ ụka;
3.Ịjụ ekwensu n’ ọlụ ya nine n’ otito ya na nlafu ya nine.
372. Ked’ ife achọgalụ n’aka ndi lulu ogo ka baptism wemia Mmimi nime fa?
ag’ akuzili fa nkuzi nke Nzukọ, fa ekwelu ife akuzigalụ fa, bia nwe ezi ebele n’im’ obi maka njọ fa.
373. Ked’ afa mili eji abaptisi?
Ọ bụ mmili dika chi si key a, ọ dizi nọfụ baptism afụ alụrụ.
374. O nwelu uzo ọzọ esi abaptisikwasi mmadu?
E ye, o nwekwazili uzo ọzọ esi abaptisi mmadụ: n’ uzo n’adirọ iji nata Baptism nke mmili.
375. ked’ ife bụ baptism nk’ ọbala?
Baptism nk’ ọbala bụ afụlụ n’ ọnwụ mmadụ fụlụ ma ‘ifi Jesu Kristi.
376. Gịnị bụ Baptism nk’ izuzu?
Ọ bụ izuzu agụ inata Baptism nke mmili, ya n’ ezi ifu-nanya Chukwu yi’ ya n’ ezi ebele nk’ obi
maka njọ, ekpo efe n’adirọ inata Baptism nke mmili.
377. Onye n’ acho nzoputa g’ anata Baptism ka?
E ye, onye nachọ nzọpụta agharọ inata Baptism makana Kristi ekwugo: ‘Belusọ m’ eji mmili na
Mmụọ-nsọ wee munwo mmadụ ọzọ, ọ m’ abanata n’ ani-eze nke Chukwu’, (John III, 5.).