MAKA SACRAMENT GA N’OGBO
351. Gịnị bụ Sacrament?
Sacrament bụ ama ife nke gratia ime, Jesu Kristi dolu an’ esi ya enye anyi gratia na nkpụlobi anyi.
352. Gịnị melu ị ji sị na Sacrament bụga ama ife?
Ọ bụ makana Sacrament bụga ifega mọbụ omumega nk’ anyi n’ ama mọbụ n’afụ anya.
353. Ked’ isi ife bụ gratia ime?
Isi ife bụ gratia ime bụ na sacrament n’ eweta gratia na Nkpụlobi anyi.
354. Onye rabalụ Sacrament ga?
Ọ bụ Nna anyi Jesu Kristi rabagalụ fa.
355. Sacrament dị one dinụ?
Sacrament dị isa: Baptism, confirmation, Eucharist dị asọ, Penance, Extreme Untion, Orders dị
asọ na Matrimony.
356. Kedu k’ anyi si malụ na Jesu Kristi rabalụ Sacrament ịsa nụnwa?
Anyi malụ ya site n’akwụkwọ dị asọ na sit’azi na nkuzi odibendi nk’ụka.
357. Sacrament n’ enye gratia ekpo nine ka?
Eye, Sacrament n’ enye ndi natalụ fa ọfụma gratia ekpo nine.
358. Sacrament g’ an agụdụ anyi nukwu agụ inatadụnụ ka?
Sacrament g’ anagụkwọ anyi nukwu agụ inatanụ makana fa bụ isi nke nzọpụta anyi.
359. Sacrament dị ụzọ one dịnu?
Sacrament dị ụzọ nabọ dịnụ: nke ndi dị ndụ na ka ọnwụ.
360. Sacrament nke ndi dị ndụ dị one?
Fa di ise: Confirmation, Eucharistia di aso, Extreme Unction: Orders di aso na Matrimony.
361. Ked’ isi ife bụ sacrament nke ndi dị ndụ?
Fa bụ Sacrament afụga ananata sọ m’ onye di ndụ nke gratia.
362. Sacrament nke ndi ọnwụ dị one?
Fa dị Sacrament nabọ: Baptism na Penance.
363. Ked isi ife bụ Sacrament ndi ọnwụ?
Isi ife bụ Sacrament nke ndi ọnwụ bụ, na fa n’ enye ndụ nke gratia na nkpụlobi, nke analụ ya
site na njọ.
364. Kedu gadụ Sacrament an’ anata sọs’ ofu ekpo?
Fa di Sacrament itọ: Baptism, Confirmation na orders dị asọ.
365. Gịnị melu eji anata Sacrament ndia sọs ofu ekpo?
Ọ bụ makana fan naka akala nrimama na nkpụlobi n’ ad’ ekwe nmechapụ.
366. Kedugadụ akalụ-nrimama afụga?
Akala –nrimama nke Baptism bụ, n’ edo anyi ụmụ nke Chukwu: nke Confirmation bụ, n’ ọn’
edo anyi ndi ọgụ nk’ Okwukwe: nke Orders dị asọ bụ, n’ ọ n’ echi ndi ụko-Chukwu
.