IWU NK’ ABỌ NK’ỤKA
326. Kedu nke bụ iwu nk’ abọ nk’ ụka?
Iwu nk’abọ nk’ ụka bụ: Ị g’anụ Mass na mbọsị ụka na mbọsị
Nsọpụlụ nine nk’iwu.
327. Kedu’ ife amal’ anyị n’ iwu nk’ abọ k’ anyị mee?
Ife amal’ anyị n’ iwu nk’ abọ a k’ anyị mee bụ
anyị nụ Mass nụsịa fa ncha n’obi ayịyọ na mbọsị ụka na
mbọsị nsọpụlụ nine nke iwu ụka n’ edebe.
328. Ọ bụ njọ ogbugbu m’ onye ghalụ inụ Mass na mbọsị
ụka na mbọsị nsọpụlụ nke iwu ka?
E ye, ọ bụ njọ ogbugbu ma-onye ghalụ inụ mass na mbọsị
afụga.
329. ** Ọ bụazị njọ ma-onye welu nneni mee k’akụkụ bụ isi
na Mass Ife ya, mobu nodu na mass n’elo if’ ozoga
kama Maka chukwu?
E ye, ọ bụ njọ ma onye kpachalụ anya.
330. Ọ bụ ọlụ nna na nne na ndị nine mmadụ binyegalụ ime
Ka ndị fa na ha bi ka fa nine nanụ mass na mbọsị
nk’iwu?
E ye, ọ bụlụ fa agadaga ọlụ ime nọfụ.