OK’ ITỌ NK’ OKWUKWE
78. Kedu nke bụ ok’ itọ nk’ okwukwe?
Ok’ itọ nk’ okwukwe bụ : Onye atụl’ im’ ya siten’ ike nke mmụọ-nsọ, mụọ ya na VeejinMarịa
79. Ked’ isi ok’ nk’itọ okwukwe a?
Isi ok’ itọ nk’ okwukwe a bụn a Chukwu Nwa wel’ arụ na nkpụrụobi dịka nk’ anyị n’ okpuru Veejin Marịa dị ngozi site na ike nke mmụọ- nsọ.
80. Jesu Kristi ọnwelụ nna n’ ụwa kaa?
Jesu Kristi n’ aka nk’ oji bụrụ Chukwu nwelụ nna, onye bụ Chukwu Nna, m ya enwerọzi nne: o bịazịa n’ akụkụ nk’ o ji bụrụ mmadụ ọnweenne m’ ya enwerọ zi nna.
81. Onye bụ Josefụ dị ngozi?
Josefụdị ngozi bu ofu onye mime ụmu- nna David, eze Judea nke nụrụ Veejin Marịa bụrụ onye anyịn’ akpọ nna Jesu Kristị bụrụazi onye nche nk’ ya.
82. Ked’ ebe amụrụ ony- nzọpụta anyị?
Ebe amụrụ onye nzọpụta bụ na Betụlụhem n’ ụnọ anụmanụ.
83. Kedu mbọsị amụrụ ony- nzọpụta anyị?
Mbọsịamụrụ onye- nzọpụta anyị bụ mbọsị Kristimaasị.