IWU NK’ ITENANỊ
315. kedu nke bụ iwu nk’ itenanị?
Iwu nk’ itenanị bụ: ‘Ngị ejina nwunye mmadụ ibe ị anya ukwu’.
316. ked’ ife iwu nk’ itenanị mabidolu?
Iwu nk’ itenanị mabidolu nkwenye nine akpachalụ anya nabọ wee
Kwenye, ilo ilulo lulu inyi, iti akpịlị agụ lulu inyi, n’ ịkpaghalị aka
n’ akụkọ ọbụna n’arụ n’ akwụrọ ọtọ, kpachal’ anya nabọ kwenye
k’ ọ bụlụ ife dị ị mma.
317. kedu njọ n’ enunye narị mmadụ n’ imelu iwu. nk’isi nya na
nk’ itenanị?
Njọ n’ enunye narị mmadụ n’imelu iwu nk’ isi n’ iwu nk’
Itenanị bụ ili oke nni, ịla ajọ manya, ịgba ọtọ, ịnọ nkịtị, ajọ
Otu, n’ inefega ayịyọ anyị anya.
318. Gịnị k’anyị g’ eme wee gbanarị njọ ndị a?
Ife anyi g’eme wee gbanarị njọ ndịa bụ ịyọ ayịyọ ekpomekpo,
ịnat’ azị sacrament ga ekpom-ekpo, ibuazị ọnụ, n’ ịyọazị Virgin
Maria ayịyọ ka-onyel’ anyị aka.