KED’ ISI IFE BỤ ‘’IWEỤ’’ ARỤ?
71. Ked’ isi ife bụ ‘’iwelụ’’ arụ?
Isi ife bụ Iwelụ arụ bụna Chukwu Nwa weelụ n’ onwe- ya ụdị mmadụ n’ adị: Okwu afụ emer’ arụ.
72. Fa dị ụdị one dị na Jesu Kristi?
Fa dị ụdị nabọ dị na Jesu Kristi: ụdị nke Chukwu n’ ụdị nke mmadụ.
73. Ọ bụ s’ ofu pesịn dị na ụdị nke Chukwu ka?
Ọ bụ s’ ofu pesịn dị na Jesu Kristi, ya bụ pesịn nke Chukwu nwa.
74. Maka gịnị k’ eji wee mee Chukwu Nwa mmadụ?
If’ eji wee meeChukwu Nwa mmadụbụ k’ ọ wegbapụta anyi na njọ, n’ ọkụ – mmụọ, na k’ ọweekuziereanyị ụzọ nk’ enuigwe.
75. Ked’ isi ife afa dị asọ Jesu nụ bụ?
Is’ ifọbụ, bụ afa dị asọ Jesu bụ, onyenzọpụta mọbụ onye – nnapụga (nnapụta)
76. Ked’ isi afa, bụ Kristi?
Isi afa bụ Kristi, bụ ‘Echil’ echi.
77. Ked’ ebe Jesu Kristi nọ?
Jesu Kristi nk’ o ji bụrụ Chukwu, ọ nọzu ebe nine, nk’ o ji bụrụ Chukwu emerụ mmadụ, ọ nọdụ n’ enuigwe ya na Sakaramenti dị ngozi nke Yukarịstịa.